27 N’ihi na ndị bi na Jeruselem na ndị na-achị ha amaghị onye a. Ma, mgbe ha na-ekpe ya ikpe, ha mezuru ihe Akwụkwọ Ndị Amụma kwuru,+ bụ́ ihe a na-agụpụta kwa ụbọchị izu ike. 28 N’agbanyeghị na ha ahụghị ihe ọ bụla mere a ga-eji gbuo ya,+ ha gwara Paịlet ka e gbuo ya.+