41 M ga-eji maka ihe na-esi ísì ọma nke ga-eme m obi ụtọ kpọpụta unu ná mba dị iche iche unu nọ, sikwa n’ala dị iche iche a chụsasịrị unu kpọkọta unu.+ A ga-esikwa n’aka unu doo m nsọ n’anya mba niile.’+
7N’ihi ya, ndị m hụrụ n’anya, ebe e kwere anyị nkwa ndị a,+ ka anyị sachapụ ihe niile na-emerụ ahụ́ anyị na obi anyị.*+ Ọ bụrụ na anyị emee ya, anyị ga-adịkwu nsọ ka anyị na-atụ egwu Chineke.