-
Ndị Rom 15:26, 27Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
26 N’ihi na obi dị ndị nọ na Masedonia na Akeya ụtọ isi n’ihe ndị ha nwere tụkọta ihe a ga-enye ndị dara ogbenye n’ime ndị nsọ nọ na Jeruselem.+ 27 N’eziokwu, obi dị ha ụtọ ime otú ahụ. Ha jidị ha ụgwọ ime ya. N’ihi na ọ bụrụ na mba dị iche iche ritere uru n’ihe Chineke nyere ndị nsọ ahụ, ha jikwa ụgwọ iji ihe ndị ha nwere jeere ndị nsọ ozi.+
-
-
2 Ndị Kọrịnt 8:14Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
14 Kama ka e jiri ihe mafọọrọ unu mejuo ihe kọrọ ndị ọzọ ugbu a, ka e jirikwa ihe mafọọrọ ha mejuo ihe kọrọ unu, ka ihe unu nwere na ihe ha nwere wee hara otu.
-