-
Ọrụ Ndịozi 15:12Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
12 Mgbe o kwuchara ihe a, ebe niile dara jụụ, mmadụ niile nọ ebe ahụ malitekwara ige Banabas na Pọl ntị ka ha na-akọ ọtụtụ ọrụ ebube Chineke si n’aka ha rụọrọ ndị mba ọzọ.
-
-
Ndị Rom 15:18, 19Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
18 N’ihi na agaghị m anwa anwa kwuo ihe ọ bụla ma ọ́ bụghị gbasara ihe Kraịst si n’aka m rụọ ka mba dị iche iche wee rubere ya isi. O si n’ihe ndị m kwuru na ihe ndị m mere rụọ ha, 19 jirikwa ọrụ ebube na ihe ịtụnanya+ nakwa ike mmụọ nsọ Chineke rụọ ha. Ọ bụ ya mere m ji nwee ike ikwusa ozi ọma banyere Kraịst nke ọma malite na Jeruselem ma gazuo Ilirikọm.+
-