5 Ọ bụrụ na anyị na ya dị n’otu maka na anyị nwụrụ ụdị ọnwụ ọ nwụrụ,+ n’eziokwu, anyị na ya ga-adịkwa n’otu maka na a ga-akpọlite anyị n’ọnwụ otú e si kpọlite ya n’ọnwụ.+
23 Ọ bụghị naanị nke ahụ, kama anyịnwa bụ́ ndị nwetara mkpụrụ mbụ ahụ, ya bụ, mmụọ ahụ, anyị na-asụkwa ude n’ime onwe anyị+ ka anyị na-echeresi ike ka e mee ka anyị bụrụ ụmụ,+ ka e jiri ihe mgbapụta tọhapụ ahụ́ anyị.
48 Ndị nọ n’ụwa a dị otú onye ahụ e ji ájá kpụọ dị. Ndị nọ n’eluigwe dịkwa otú onye ahụ si n’eluigwe dị.+49 Otú ahụ anyị yiri onye ahụ e ji ájá kpụọ+ ka anyị ga-eyikwa onye ahụ si n’eluigwe.+