-
Ọrụ Ndịozi 21:20, 21Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
20 Mgbe ha nụrụ ihe a, ha malitere ito Chineke. Ma, ha gwakwara Pọl, sị: “Nwanna anyị, ị manụ na e nwere ọtụtụ puku ndị Juu na-eso ụzọ Jizọs, nakwa na ha ji Iwu Mosis kpọrọ ihe.+ 21 Ma ha nụrụ ka ndị mmadụ na-asị: ‘Pọl na-akụziri ndị Juu niile nọ ná mba ọzọ ka ha ghara ime ihe Iwu Mosis kwuru. Ọ na-agwakwa ha ka ha ghara ibi ụmụ ha úgwù, gharakwa ime omenala anyị dị iche iche.’+
-