-
Ndị Rom 4:11, 12Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
11 Chineke gwara ya ka o bie úgwù. Úgwù o biri bụ ihe àmà+ gosiri na okwukwe o nwere mere ka ọ bụrụ onye ezi omume mgbe ọ na-ebibeghị úgwù. O si otú ahụ bụrụ nna ndị niile nwere okwukwe+ n’agbanyeghị na ha bụ ndị a na-ebighị úgwù, Chineke wekwaara ha ka ndị ezi omume; 12 Ebreham bụkwa nna ndị e biri úgwù. Ọ bụghị naanị nna ndị e biri úgwù, kama ọ bụkwa nna ndị nwere okwukwe ka ya. Nna anyị Ebreham+ nwere okwukwe ahụ mgbe ọ na-ebibeghị úgwù.
-