-
1 Ndị Kọrịnt 12:13Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
13 E ji otu mmụọ nsọ mee anyị niile baptizim, anyị abụrụ otu ahụ́, ma ànyị bụ ndị Juu ma ànyị bụ ndị Grik, ma ànyị bụ ndị ohu ma ànyị bụ ndị nweere onwe ha. Anyị niile nwekwara otu mmụọ nsọ.
-
-
Ndị Kọlọsi 3:10, 11Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
10 ma yirinụ àgwà* ọhụrụ,+ nke Chineke na-eme ka anyị na-akpa ma anyị mata ya nke ọma. Ọ bụ ya ga-eme ka àgwà anyị na-agbanwe, na-adị ka nke Chineke.+ 11 Ihe a gbasara ma onye Grik ma onye Juu, ma onye e biri úgwù ma onye a na-ebighị úgwù, ma onye mba ọzọ ma onye Sitia,* ma ohu ma onye nweere onwe ya. Ma, Kraịst bụ ihe niile, anyị na ya dịkwa n’otu.+
-