-
Ndị Efesọs 5:25-27Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
25 Ndị bụ́ di, hụnụ nwunye unu n’anya+ otú ahụ Kraịst hụkwara ọgbakọ ya n’anya ma nwụọ maka ya,+ 26 iji doo ya nsọ, jirikwa mmiri nke okwu Chineke saa ya, ya adị ọcha.+ 27 O mere ihe ndị a ka ọgbakọ maa mma n’anya ya, ghara inwe ntụpọ ma ọ bụ nkwarụ ma ọ bụ ihe ọ bụla yiri ya,+ kama ka ọ dị nsọ, gharakwa inwe ihe ga-emerụ ya.+
-