-
Ndị Hibru 4:15, 16Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
15 N’ihi na nnukwu onye nchụàjà anyị nwere abụghị onye na-agaghị aghọtali* na anyị adịghị ike,+ kama a nwalere ya n’ụzọ niile otú e si anwale anyịnwa, ma o mehieghị.+ 16 N’ihi ya, ka anyị bịa nso n’ocheeze Chineke onye na-eme amara ma jiri obi ike na-ekpe ekpere,+ ka e wee meere anyị ebere, anyị enwetakwa amara ya n’oge kwesịrị ekwesị.
-