-
Ndị Hibru 10:19-22Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
19 Ụmụnna m, ebe ọ bụ na ọbara Jizọs na-eme ka obi sie anyị ike isi n’ụzọ e si abanye n’ebe nsọ*+ ahụ na-abanye, 20 bụ́ ụzọ ọhụrụ o megheere anyị nke na-eduba ná ndụ, nke e si n’ákwà mgbochi ahụ abanye,+ ya bụ, ahụ́ ya, 21 ebe ọ bụkwa na anyị nwere onye nchụàjà ukwu na-elekọta ụlọ Chineke,+ 22 ka anyị jiri ezi obi na-abịa Chineke nso ma nwee okwukwe siri ezigbo ike, ebe ọ bụ na e meela ka obi anyị dị ọcha ka anyị ghara inwe akọnuche ọjọọ,+ e jirikwa mmiri dị ọcha sachaa ahụ́ anyị.+
-