-
Ndị Efesọs 6:14-17Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
14 N’ihi ya, kwụrụnụ chịm. Werenụ eziokwu kee úkwù unu.+ Yirinụ ezi omume ka ihe e ji echebe obi,+ 15 yirikwanụ akpụkpọ ụkwụ n’ụkwụ unu iji jikere maka izisa ozi ọma nke udo.+ 16 E wezụgakwa ihe a niile, burunụ nnukwu ọta bụ́ okwukwe,+ nke unu ga-eji nwee ike imenyụ akụ́ niile na-ere ọkụ nke ajọ onye ahụ na-agba.+ 17 Kpurunụ okpu agha bụ́ nzọpụta,+ jirikwanụ mma agha nke mmụọ nsọ n’aka unu, ya bụ, okwu Chineke.+
-