11 N’ihi na e nweghị mgbe a na-agaghị enwe onye dara ogbenye n’ala unu.+ Ọ bụ ya mere m ji na-enye unu iwu, sị, ‘Mesapụrụnụ nwanne unu nọ n’ahụhụ nke dakwara ogbenye n’ala unu aka.’+
27 Ofufe* dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ n’anya Chineke Nna anyị bụ: mmadụ inyere ụmụ na-enweghị nne na nna+ na ụmụ nwaanyị isi mkpe+ na-ata ahụhụ aka,+ nakwa mmadụ ịhụ na ụwa a emebighị ya.+