-
Ọpụpụ 12:21-23Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
21 Mosis kpọrọ ndị okenye niile nke Izrel ngwa ngwa,+ sị ha: “Onye ọ bụla gaa họrọ anụmanụ* maka ezinụlọ ya, gbuokwanụ anụmanụ ahụ maka Ememme Ngabiga. 22 Unu ga-ewere ùkwù ahịhịa hisop bịanye n’ọbara dị n’efere ma tee ọbara ahụ n’elu ọnụ ụzọ unu nakwa n’awara ya abụọ. E nweghịkwa onye ọ bụla n’ime unu ga-apụta n’ọnụ ụzọ ụlọ ya ruo n’ụtụtụ. 23 Mgbe Jehova ga-agafe ka ọ taa ndị Ijipt ahụhụ, wee hụ ọbara ahụ n’elu ọnụ ụzọ nakwa n’awara ya abụọ, Jehova ga-agafere ọnụ ụzọ ahụ. Ọ gaghị ekwe ka ahụhụ ahụ* gbuo onye ọ bụla n’ụlọ unu.+
-