-
Ọpụpụ 17:1-3Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 Nzukọ Izrel niile si n’ala ịkpa Sin pụọ.+ Ọ na-abụ ha si otu ebe kwalie, ha agaa n’ebe ọzọ, otú Jehova nyere ha n’iwu.+ Ha wee maa ụlọikwuu na Refidim.+ Ma mmiri ha ga-aṅụ adịghị.
2 Ndị Izrel wee malite isesa Mosis okwu,+ sị: “Nye anyị mmiri ka anyị ṅụọ.” Ma Mosis sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-esesa m okwu? Gịnị mere unu ji na-anwa Jehova ọnwụnwa?”+ 3 Ma agụụ mmiri nọ na-agụsi ha ike n’ebe ahụ. Ha nọkwa na-akatọ* Mosis,+ sị: “Gịnị mere i ji kpọpụta anyị n’Ijipt ka agụụ mmiri gụgbuo anyị na ụmụ anyị na anụ ụlọ anyị?”
-