-
1 Timoti 5:1, 2Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
5 Ejila iwe agwa okenye okwu.+ Kama, na-agwa ya okwu otú i si agwa nna gị, na-agwakwa ụmụ okorobịa okwu otú i si agwa ụmụnne gị ndị nwoke. 2 Na-agwakwa ụmụ nwaanyị merela agadi okwu otú i si agwa ndị nne, na-agwakwa ụmụ agbọghọ okwu otú i si agwa ụmụnne gị ndị nwaanyị, n’ebughị ihe ọjọọ ọ bụla n’obi.
-