-
Ndị Rom 13:3, 4Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
3 N’ihi na a na-atụ ndị na-achị achị egwu, ma ọ bụghị ndị na-eme ihe ọma na-atụ ha egwu, kama ọ bụ ndị na-eme ihe ọjọọ.+ Ị̀ chọrọ ka ị ghara ịna-atụ ndị ọchịchị egwu? Mewe ihe ọma,+ ha ga-ajakwa gị mma. 4 N’ihi na ha bụ ndị na-ejere Chineke ozi ka ihe wee gaziere gị. Ma ọ bụrụ na ị na-eme ihe ọjọọ, tụọ egwu n’ihi na ha anaghị ebu mma agha na nkịtị. Ha bụ ndị na-ejere Chineke ozi, ndị na-ata ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ.
-