21 “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-aba n’Alaeze eluigwe. Kama ọ bụ naanị onye na-eme uche Nna m nke nọ n’eluigwe ga-aba na ya.+
40 N’ihi na uche Nna m bụ ka onye ọ bụla nke nabatara Ọkpara ahụ ma nwee okwukwe na ya nwee ndụ ebighị ebi.+ M ga-akpọlitekwa ya n’ọnwụ+ n’ụbọchị ikpeazụ.”