-
3 Jọn 9, 10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 E nwere akwụkwọ ozi m detaara ọgbakọ, ma Dayotrefis, onye na-achọ ịbụ onye mbụ n’ime ha,+ anaghị akwanyere ihe ọ bụla si n’aka anyị ùgwù.+ 10 N’ihi ya, ọ bụrụ na mụ abịa, m ga-eme ka a mata ọrụ ndị ọ na-arụ, na ọ na-akọsa ihe na-abụghị eziokwu* banyere anyị.+ Nke a ezughịrị ya. Ọ naghịdị anabata ụmụnna+ nke ọma. Ọ na-agbalịkwa igbochi ndị chọrọ ịnabata ha, na-achụpụkwa ha n’ọgbakọ.
-