11 Nwoke ahụ nne ya bụ onye Izrel malitere ikwutọ aha Chineke* ma kpọọ Chineke iyi.+ E wee kpọgara ya Mosis.+ Aha nne ya bụ Shelomit, nwa Dibraị, onye si n’ebo Dan.
14 “Si n’ebe unu mara ụlọikwuu kpọpụ onye ahụ kwutọrọ aha m. Ndị niile nụrụ mgbe o kwutọrọ aha m ga-ebikwasị ya aka n’isi. Nzukọ ahụ niile ga-atụkwa ya nkume.+