14M wee hụ Nwa Atụrụ ahụ+ ka o guzo n’Ugwu Zayọn,+ ya na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000).+ E dere aha ya na aha Nna ya+ n’egedege ihu ha.
3 Ha na-abụkwa abụ yiri abụ ọhụrụ+ n’ihu ocheeze ahụ na n’ihu ndị mmụọ ozi anọ ahụ*+ na n’ihu ndị okenye ahụ.+ O nweghịkwa onye mụtaliri abụ ahụ ma e wezụga otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000) ahụ,+ ndị Chineke zụtara n’ụwa.