26 “Ọ bụrụ na onye ọ bụla abịakwute m ma ọ hụghị m n’anya karịa nne ya na nna ya na nwunye ya na ụmụ ya na ụmụnne ya ndị nwoke na ụmụnne ya ndị nwaanyị, nakwa ndụ ya,*+ ọ gaghị abụli onye na-eso ụzọ m.+
24 Ka o sina dị, o nweghị ihe m ji ndụ m* kpọrọ. Ihe bụ́ mkpa m bụ ime ihe niile m kwesịrị ime+ na ịrụcha ọrụ Onyenwe anyị Jizọs nyere m. Ọrụ ahụ bụ izi ndị mmadụ ozi ọma nke ọma gbasara amara Chineke meere anyị.