-
Jeremaya 25:15Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
15 Jehova bụ́ Chineke Izrel gwara m, sị: “Nara m iko mmanya a nke iwe m dị ọkụ, meekwa ka mba niile m ga-eziga gị ṅụọ ihe dị n’ime ya.
-
-
Mkpughe 14:9, 10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 Mmụọ ozi nke atọ wee sochie ha, jiri oké olu sị: “Onye ọ bụla a kara akara n’egedege ihu ya ma ọ bụ n’aka ya,+ nke na-efekwa anụ ọhịa ahụ+ na ihe ahụ yiri ya a kpụrụ akpụ, 10 ga-aṅụkwa mmanya Chineke, nke bụ́ iwe ya. A gwaghị mmanya a agwa. Chineke ga-agbanyekwa ya n’iko iwe ya.+ A ga-ejikwa ọkụ na sọlfọ+ mekpaa onye ahụ ahụ́ n’ihu ndị mmụọ ozi dị nsọ na n’ihu Nwa Atụrụ ahụ.
-