Samuel nke Abụọ
1 Mgbe Sọl nwụchara, Devid nọrọ ụbọchị abụọ na Ziklag+ mgbe o merichara* ndị Amalek lọta. 2 N’ụbọchị nke atọ, otu nwoke si n’ebe ndị agha Sọl mara ụlọikwuu bịa. Ọ dọwara uwe ya adọwa, kpokwasịkwa ájá n’isi ya. Mgbe ọ bịakwutere Devid, ọ dara n’ala, kpọọkwa isiala.
3 Devid asị ya: “Ebee ka i si?” Ya asị: “Esi m ebe ndị agha Izrel mara ụlọikwuu gbapụta.” 4 Devid ajụọ ya sị: “Olee otú ihe si gaa? Biko, kọọrọ m.” Ya asị: “Ndị Izrel esila n’ọgbọ agha gbaa ọsọ. Ọtụtụ n’ime ha anwụọkwala. Sọl na Jonatan nwa ya anwụọkwala.”+ 5 Devid ajụọ ya, sị: “Olee otú i si mara na Sọl na Jonatan nwa ya anwụọla?” 6 Nwoke ahụ asị ya: “Ọ dabara na m nọ n’Ugwu Gilboa,+ Sọl adabere n’ube ya, ndị gba ụgbọ ịnyịnya na ndị gba ịnyịnya achụkwute ya.+ 7 Mgbe ọ tụgharịrị hụ m, ọ kpọrọ m, mụ asị, ‘Lee m.’ 8 Ya ajụọ m, sị, ‘Ị̀ bụ onye?’ Mụ asị ya, ‘Abụ m onye Amalek.’+ 9 Ya asịzie m, ‘Biko, bịa gbuo m, n’ihi na n’agbanyeghị na m ka dị ndụ,* emerụọla m ezigbote ahụ́.’ 10 N’ihi ya, m gara gbuo ya,+ maka na m ma na ahụ́ ahụ o merụrụ ka ga-egbu ya ma ọ daruo ala. M wekwaara okpueze o kpu n’isi na ọla ọ gba n’aka, sị ka m wetara ha onyenwe m ebe a.”
11 Devid wee dọwaa uwe ya, ndị niile so ya adọwaakwa nke ha. 12 Ha nọkwa na-eti mkpu, na-ebe ákwá, na-ebu ọnụ+ ruo anyasị n’ihi Sọl na Jonatan nwa ya nakwa n’ihi ndị Jehova, ya bụ, n’ihi ọtụtụ ndị Izrel+ e ji mma agha gbuo.
13 Devid wee jụọ onye ahụ kọọrọ ya ihe ahụ, sị: “Ị̀ bụ onye ebee?” Ya asị: “Abụ m nwa onye Amalek, onye mbịarambịa n’Izrel.” 14 Devid asị ya: “Gịnị mere na ụjọ atụghị gị igbu onye Jehova tere mmanụ?”+ 15 Devid wee gwa otu n’ime ndị ahụ so ya, sị: “Gaa gbuo ya.” Ya agaa jiri mma agha gbuo ya.+ 16 Devid asị ya: “Ka ọbara gị dịrị gị n’isi, n’ihi na i ji ọnụ gị kwuo na ọ bụ gị gburu onye Jehova tere mmanụ.”+
17 Devid wee jiri Sọl na Jonatan nwa ya bụọ abụ iru uju,+ 18 sịkwa ka a kụziere ndị Juda abụ iru uju ahụ. A na-akpọ abụ ahụ “Ụta.” E dere ya n’akwụkwọ Jesha, sị:+
19 “Izrel, e gbuola ndị gị mara mma, ha atọgbọrọ n’ebe ndị dị elu dị n’ala gị.+
Ndị dike anwụọkwala n’agha.
20 Unu akọla akụkọ ya na Gat.+
Unu akọsala ya n’okporo ámá Ashkelọn,
Ka ụmụ nwaanyị ndị Filistia ghara ịṅụrị ọṅụ,
Ka ụmụ nwaanyị nke ndị a na-ebighị úgwù ghara inwe obi ụtọ.
Ka ubi unu gharakwa imepụta nri ọ bụla a ga-eji chụọ àjà,+
N’ihi na n’ebe ahụ ka e merụrụ ọta ndị dike.
Ọta Sọl abụghịzi ọta e tere mmanụ.
22 Ụta Jonatan anaghị ahapụ ịtụ ebe a chọrọ ka ọ tụọ.+
Mma agha Sọl anaghị ahapụ ime ihe a chọrọ ka o mee.+
Ụta na mma agha ahụ gburu ndị dike. Ọbara ndị iro jukwara na ha.
23 Sọl na Jonatan+ bụ ndị a hụrụ n’anya na ndị e ji kpọrọ ihe n’oge ha dị ndụ.
E kewaghịkwa ha n’ọnwụ.+
Ha na-efe ọsọ karịa ugo.+
Ha dịkwa ike karịa ọdụm.+
24 Ụmụ nwaanyị Izrel, beerenụ Sọl ákwá,
Onye yiwere unu uwe uhie* na uwe a chọrọ mma,
Onye tinyere ihe e ji achọ mma e ji ọlaedo mee n’uwe unu.
25 Ndị Izrel, ndị dike unu adaala n’ọgbọ agha.
A nọ n’ebe dị elu n’ala unu gbuo Jonatan.+
26 Nwanne m Jonatan, ọnwụ gị agbawaala m obi.
Ị bụ ezigbote enyi m.+
Otú i si hụ m n’anya karịrị otú ụmụ nwaanyị si ahụ mmadụ n’anya.+
27 Ndị dike anwụọla.
Ngwá agha alaakwala n’iyi.”