Abụ Ọma
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ; nke ụda Gitit.* Abụ Devid.
8 Onyenwe anyị Jehova, aha gị dị nnọọ ebube n’ebe niile n’ụwa.
I meela ka ebube gị dị ukwuu karịa eluigwe.*+
2 N’ihi ndị iro gị,
I sila n’ọnụ ụmụaka na ụmụ ọhụrụ+ gosi ike gị,
Ka i wee mee ka onye iro na onye na-emegide gị mechie ọnụ.
3 Mgbe m hụrụ eluigwe gị, bụ́ ọrụ aka* gị,
Ọnwa na kpakpando ndị i kere,+
4 Gịnị ka mmadụ efu bụ nke mere i ji na-echeta ya?
Gịnịkwa ka nwa nke mmadụ bụ nke mere i ji na-elekọta ya?+
5 I mere ka ndị mmụọ ozi* katụ ya.
I ji ebube na ùgwù chọọ ya mma.
6 I mere ka o lekọtawa ọrụ aka gị.+
I mere ka ihe niile nọrọ n’okpuru ya:
7 Ìgwè ewu na atụrụ niile na ehi,
Nakwa anụ ọhịa dị iche iche,+
8 Nnụnụ na azụ̀,
Ihe ọ bụla na-egwugharị n’oké osimiri.
9 Onyenwe anyị Jehova, aha gị dị nnọọ ebube n’ebe niile n’ụwa.