Ndị Ikpe
13 Ndị Izrel malitekwara ime ihe dị njọ n’anya Jehova.+ Jehova wee nyefee ha n’aka ndị Filistia+ ruo afọ iri anọ.
2 N’oge ahụ, e nwere otu nwoke onye Zora+ aha ya bụ Manoa.+ O si n’ezinụlọ ebo Dan.+ Nwunye ya bụ nwaanyị aga. Ọ mụtaghị nwa.+ 3 Ka oge na-aga, mmụọ ozi Jehova pụtara n’ihu nwaanyị ahụ wee sị ya: “Ị bụ nwaanyị aga. Ị mụtaghị nwa. Ma ị ga-adị ime mụọ nwa nwoke.+ 4 Lezie anya ka ị ghara ịṅụ mmanya ma ọ bụ ihe ọ bụla na-aba n’anya.+ Erikwala ihe ọ bụla na-adịghị ọcha.+ 5 Ị ga-adị ime, mụọ nwa nwoke. Agụba ọ bụla agaghị emetụ ya n’isi+ n’ihi na nwa ahụ ga-abụ onye Naziraịt nke Chineke malite mgbe a mụrụ ya.* Ọ ga-amalitekwa ịzọpụta ndị Izrel n’aka ndị Filistia.”+
6 Nwaanyị ahụ wee gaa gwa di ya, sị: “Otu onye nke ezi Chineke bịakwutere m. O yiri mmụọ ozi nke ezi Chineke. Ọ dị ebube. Ajụghị m ya ebe o si bịa, ọ gwaghịkwa m aha ya.+ 7 Ma ọ sịrị m, ‘Ị ga-adị ime, mụọ nwa nwoke. Aṅụla mmanya ma ọ bụ ihe ọ bụla na-aba n’anya. Erikwala ihe ọ bụla na-adịghị ọcha n’ihi na nwa ahụ ga-abụ onye Naziraịt nke Chineke malite mgbe a mụrụ ya* ruo ụbọchị ọ ga-anwụ.’”
8 Manoa rịọrọ Jehova, sị: “Ewela iwe, Jehova. Biko, ka onye nke ezi Chineke i zitere bịaghachi gwa anyị ihe anyị kwesịrị ime nwa ahụ a ga-amụ.” 9 Ezi Chineke wee gee Manoa ntị. Mmụọ ozi nke ezi Chineke bịakwutere nwaanyị ahụ ọzọ mgbe ọ nọ ọdụ n’ubi. Manoa di ya esoghị ya nọrọ n’ebe ahụ. 10 Nwaanyị ahụ gbaara ọsọ ozugbo gaa gwa di ya, sị: “Nwoke ahụ nke pụtara n’ihu m n’ụbọchị ahụ abịakwutela m ọzọ.”+
11 Manoa wee bilie soro nwunye ya gawa. Ọ bịakwutere nwoke ahụ, sị ya: “Ọ̀ bụ gị bụ nwoke ahụ gwara nwunye m okwu?” Ọ sịrị: “Ọ bụ m.” 12 Manoa wee sị ya: “Ka ihe i kwuru mezuo. Olee ụdị ndụ nwa ahụ ga-ebi, gịnịkwa ga-abụ ọrụ ya?”+ 13 Mmụọ ozi Jehova wee sị Manoa: “Nwunye gị kwesịrị izere ihe niile m gwara ya zere.+ 14 O kwesịghị iri ihe ọ bụla si n’osisi vaịn. O kwesịghị ịṅụ mmanya ma ọ bụ ihe ọ bụla na-aba n’anya,+ o kwesịghịkwa iri ihe ọ bụla na-adịghị ọcha.+ Ya debe ihe niile m nyere ya n’iwu.”
15 Manoa gwaziri mmụọ ozi Jehova, sị: “Biko, nọtụkwuo ka anyị gbuoro gị nwa ewu.”+ 16 Ma mmụọ ozi Jehova gwara Manoa, sị: “Ọ bụrụ na mụ anọtụkwuo, agaghị m eri nri gị. Ma, ọ bụrụ na ị chọrọ ịchụrụ Jehova àjà a na-esu ọkụ, chụọ ya.” Manoa amaghị na ọ bụ mmụọ ozi Jehova. 17 Manoa wee sị mmụọ ozi Jehova: “Gịnị bụ aha gị,+ ka anyị wee sọpụrụ gị mgbe ihe i kwuru mezuru?” 18 Ma mmụọ ozi Jehova sịrị ya: “Gịnị mere i ji ajụ m aha m, ebe ọ bụ aha dị ebube?”
19 Manoa wee were nwa ewu na ọka chụọrọ Jehova àjà n’elu nkume. Ọ* nọkwa na-eme ihe dị ịtụnanya ka Manoa na nwunye ya nọ na-ele anya. 20 Mgbe ọkụ si n’ebe ịchụàjà ahụ na-enwuli elu, mmụọ ozi Jehova sooro ọkụ si n’ebe ịchụàjà ahụ gbagoo elu ka Manoa na nwunye ya nọ na-ele anya. Ha gburu ikpere n’ala ozugbo, kpudo ihu n’ala. 21 Mmụọ ozi Jehova apụtaghị n’ihu Manoa na nwunye ya ọzọ. Manoa wee mata na ọ bụ mmụọ ozi Jehova.+ 22 Manoa sịziri nwunye ya: “Anyị ga-anwụrịrị n’ihi na ọ bụ Chineke ka anyị hụrụ.”+ 23 Ma nwunye ya sịrị ya: “Ọ bụrụ na Jehova chọrọ igbu anyị, ọ garaghị anara anyị àjà a na-esu ọkụ+ na àjà ọka anyị chụrụ, ọ garaghị egosi anyị ihe a niile, ọ garaghịkwa agwa anyị nke ọ bụla n’ihe ndị a.”
24 Nwaanyị ahụ mechara mụọ nwa nwoke ma gụọ ya Samsịn.+ Nwa ahụ wee na-eto, Jehova nọkwa na-agọzi ya. 25 Ka oge na-aga, mmụọ Jehova malitere ịkpa ike n’ahụ́ ya+ na Mehane-dan,+ nke dị n’agbata Zora na Eshtaọl.+