Ndị Ikpe
12 E wee kpọkọta ụmụ nwoke ndị Ifrem, ha wee gafee rute Zefọn* ma sị Jefta: “Gịnị mere na ị kpọghị anyị ka anyị soro gị mgbe ị na-aga ịlụso ndị Amọn agha?+ Anyị ga-agbakọta gị na ụlọ gị ọkụ.” 2 Ma Jefta gwara ha, sị: “Ndị Amọn sesara mụ na ndị m ezigbo okwu. M kpọrọ unu ka unu nyere m aka, ma unu azọpụtaghị m n’aka ha. 3 Mgbe m hụrụ na unu agaghị azọpụta m, m kpebiziri ime ihe gaara ata isi m ma gaa lụso ndị Amọn+ agha, Jehova nyefekwara ha n’aka m. Gịnịzi mere unu ji bịa ịlụso m agha taa?”
4 Jefta wee kpọkọta ndị Gilied+ niile ozugbo ma lụso ndị Ifrem agha. Ndị Gilied meriri ndị Ifrem, bụ́ ndị sịrị: “Unu si n’Ifrem gbapụ, unu ndị Gilied ndị nọ n’Ifrem nakwa na Manase.” 5 Ndị Gilied bu ndị Ifrem ụzọ ruo ebe ndị a na-eji ụkwụ agafe Osimiri Jọdan+ ma nọchie ebe ahụ. Mgbe ndị Ifrem na-achọ ịgbalaga, ha na-asị, “Ka m gafere.” Ndị Gilied na-ajụ onye ọ bụla n’ime ha, sị: “Ị̀ bụ onye Ifrem?” Ọ bụrụ na ọ sị, “Mba,” 6 ha asị ya: “Biko, kpọgodị Shibolet.” Ma onye ahụ na-asị: “Sibolet,” n’ihi na ọ gaghị akpọtali okwu ahụ. Ha na-ejide ya ma gbuo ya n’ebe ndị a na-eji ụkwụ agafe Osimiri Jọdan. Ndị Ifrem e gburu n’oge ahụ dị puku iri anọ na puku abụọ (42,000).
7 Jefta kpere Izrel ikpe ruo afọ isii. Jefta onye Gilied mechara nwụọ, e lie ya n’obodo ya nke dị na Gilied.
8 Onye nọchiri ya bụ Ịbzan onye Betlehem. O kpere Izrel ikpe.+ 9 Ọ mụrụ ụmụ nwoke iri atọ na ụmụ nwaanyị iri atọ. O dupụrụ ụmụ ya ndị nwaanyị ka ha gaa lụọ ụmụ nwoke ndị na-esighị n’ọnụmara ya. Ọ lụtakwaara ụmụ ya ndị nwoke ụmụ nwaanyị iri atọ na-esighị n’ọnụmara ya. O kpere Izrel ikpe ruo afọ asaa. 10 Ịbzan wee nwụọ, e lie ya na Betlehem.
11 Onye nọchiri ya bụ Ịlọn onye Zebulọn. O kpere Izrel ikpe ruo afọ iri. 12 Ịlọn onye Zebulọn wee nwụọ, e lie ya n’Aịjalọn nke dị na Zebulọn.
13 Onye nọchiri ya bụ Abdọn nwa Hilel onye Piratọn. O kpere Izrel ikpe. 14 Ọ mụrụ ụmụ nwoke iri anọ, nweekwa ụmụ ụmụ ndị nwoke iri atọ. Onye ọ bụla n’ime ha nwere otu jakị ọ na-agba.* O kpere Izrel ikpe ruo afọ asatọ. 15 Abdọn nwa Hilel onye Piratọn wee nwụọ, e lie ya na Piratọn nke dị n’Ifrem, n’ugwu ndị Amalek.+