Esta
7 Eze na Heman+ wee bịa oriri Esta nwunye eze kpọrọ ha. 2 N’ụbọchị nke abụọ ahụ, n’oge ha na-aṅụ mmanya n’oriri ahụ, eze gwara Esta ọzọ, sị: “Esta nwunye m, gịnị ka ị na-arịọ ka e meere gị? M ga-emere gị ya. Gịnịkwa ka ị chọrọ ka m meere gị? Ọ bụrụgodị na ị chọrọ ọkara alaeze m, m ga-enye gị ya.”+ 3 Esta nwunye eze wee sị: “Eze, ọ bụrụ na ihe m dị gị mma, ọ bụrụkwa na ọ dị eze mma, m na-arịọ ka ị zọọ ndụ m.* M na-arịọkwa ka ị napụta ndị m.+ 4 N’ihi na e reela anyị,+ mụ na ndị m, ka a laa anyị n’iyi, gbuo anyị ma bibie anyị.+ A sị na e rere anyị ka anyị ghọọ ụmụ nwoke na-agba ohu na ụmụ nwaanyị na-agba ohu, m gaara agbachi nkịtị. Ma ọdachi a agaghị abara eze uru, kama, ọ ga-emebiri ya ihe.”
5 Eze Ahazuirọs wee sị Esta nwunye ya: “Ònye bụ onye ahụ? Ebeekwa ka onye ahụ obi kara ime ụdị ihe a nọ?” 6 Esta asị: “Ọ bụ Heman ọjọọ a bụ onye ahụ na-emegide anyị na onye iro anyị.”
Ezigbo ụjọ jidere Heman n’ihi eze na nwunye ya. 7 Ma eze ji iwe na ọnụma si ebe ahụ ha na-aṅụ mmanya bilie gaa n’ogige dị n’obí ya. Ma, Heman biliri gaa ka ọ rịọ Esta nwunye eze ka ọ zọọ ndụ ya,* n’ihi na ọ hụla na eze ekpebiela ịkwụ ya ụgwọ ihe o metara. 8 Eze wee si n’ogige ahụ dị n’obí ya laghachi n’ụlọ ahụ ha nọ na-aṅụ mmanya ma hụ na Heman adakwasịla n’elu àkwà* Esta nọ. Eze wee tie, sị: “Ị̀ ga-edinakwa nwunye m n’ike n’ụlọ m?” Ozugbo Eze kwuru ihe a, ndị na-ejere ya ozi bịara kpuchie Heman ihu. 9 Habona,+ otu n’ime ndị na-eje ozi n’obí eze, wee sị: “E nwekwara osisi Heman gwunyere n’ala ka e jiri kwụgbuo Mọdekaị,+ onye kwuru ihe mere ka a ghara igbu eze.+ E gwunyere ya n’ụlọ Heman. Ogo ya dị kubit iri ise.”* Eze wee sị: “Kwụwanụ ya n’elu ya.” 10 Ha wee kwụwa Heman n’osisi ahụ o gwunyere n’ala maka Mọdekaị, iwe eze adajụọkwa.