Esta
7 Eze na Heman+ wee gaa ka ha na Esta nwunye eze rie oriri. 2 Eze wee gwa Esta n’ụbọchị nke abụọ n’oge oriri+ ahụ, sị: “Gịnị ka ị na-arịọ ka e meere gị,+ Esta nwunye m? Ka e nye gị ya.+ Gịnịkwa ka ị chọrọ ka m meere gị? Ọ bụrụgodị ọkara alaeze m,+ a ga-enye gị ya!” 3 Esta nwunye eze wee zaa, sị: “Ọ bụrụ na ihe m dị gị mma, eze, ọ bụrụkwa na ọ dị eze mma, m na-arịọ ka e nye m mkpụrụ obi m,+ m na-arịọkwa ka e nye m ndị m.+ 4 N’ihi na e rewo anyị,+ mụ na ndị m, ka a laa anyị n’iyi, gbuo anyị ma bibie anyị.+ A sị na e rere anyị ka anyị ghọọ ndị ikom na-agba ohu+ na ndị inyom na-eje ozi, m gaara agbachi nkịtị. Ma ọdachi a ekwesịghị ekwesị ma ọ bụrụ na o mebiere eze ihe.”
5 Eze Ahazuirọs wee gwa Esta nwunye ya, sị: “Ònye bụ onye ahụ,+ oleekwa ebe onye obi kara+ ime otú ahụ nọ?” 6 Esta wee sị: “Nwoke ahụ, onye mmegide+ ahụ na onye iro+ ahụ, bụ Heman ọjọọ a.”
Ma ụjọ jidere+ Heman nke ukwuu n’ihi eze na nwunye ya. 7 Ma eze jiri oké iwe+ bilie n’ebe ahụ a na-eri oriri gaa n’ubi nke dị n’obí ya; Heman wee bilie ịga rịọ Esta nwunye eze+ arịrịọ maka mkpụrụ obi ya, n’ihi na ọ hụrụ na eze+ ekpebiwo+ ime ya ihe ọjọọ. 8 Eze wee si n’ubi ahụ dị n’obí ya lọghachi n’ụlọ ahụ ha nọ na-eri oriri;+ Heman wee dakwasị n’elu ihe ndina+ Esta nọ. Eze wee sị: “Ị̀ ga-edinakwa nwunye m n’ike, mgbe m nọ n’ụlọ?” Eze wee kwuo okwu,+ e wee were ihe kpuchie Heman ihu. 9 Habona,+ otu n’ime ndị na-eje ozi+ n’obí eze bụ́ onye guzo n’ihu eze, wee sị: “E nwekwara osisi+ nke Heman rụrụ maka Mọdekaị, bụ́ onye kwuru ihe dị mma banyere eze.+ E gwunyere ya n’ụlọ Heman, ogo ya dị kubit iri ise.” Eze wee sị: “Kwụwanụ ya n’elu ya.”+ 10 Ha wee kwụwa Heman n’osisi+ ahụ ọ kwadebere maka Mọdekaị;+ ọnụma eze wee dajụọ.