Abụ Solomọn
1 Abụ kacha abụ niile. Ọ bụ Solomọn dere abụ a:+
Aha gị dị ka mmanụ na-esi ísì ọma a na-awụpụta awụpụta.+
Ọ bụ ya mere ụmụ agbọghọ ji hụ gị n’anya.
Eze akpọbatala m n’ime ime ụlọ ya.
Ka anyị ṅụrịa ọṅụ ma mee onwe anyị obi ụtọ.
Ka anyị kwuo banyere otú i si egosi m na ị hụrụ m n’anya karịa ikwu banyere mmanya.
Ka a sịkwa ihe mere ha* ji hụ gị n’anya.
5 Ụmụ nwaanyị Jeruselem, adị m oji, ma m mara mma.
M dị ka ụlọikwuu ndị Kida,+ m dịkwa ka ákwà ụlọikwuu+ Solomọn.
6 Unu elela m anya maka na m dị oji,
N’ihi na anyanwụ agbajiela m.
Ụmụnne m ndị nwoke wesara m iwe.
Ha nyere m ọrụ ilekọta ubi vaịn,
Ma elekọtaghị m ubi vaịn nke m.
7 Onye m hụrụ n’anya nke ukwuu,
Gwa m ebe ị nọ na-azụ ìgwè atụrụ gị,+
Ebe ị na-edu ha aga ka ha makpuru ala n’etiti ehihie.
Gwa m, ka m ghara ịna-agagharị n’ebe ìgwè atụrụ ndị enyi gị nọ
Ka nwaanyị ji ákwà kpuchie ihu ya.”
8 “Gị nwaanyị kacha ụmụ nwaanyị niile mma, ọ bụrụ na ị maghị ebe ọ nọ,
Soro ụzọ ebe ìgwè atụrụ si aga
Duru ìgwè ewu gị gaa n’ebe ndị na-azụ atụrụ mara ụlọikwuu, ka ha taa ahịhịa.”
9 “Onye m hụrụ n’anya, ị mara mma ka nne ịnyịnya* nke so n’ịnyịnya ndị na-adọkpụ ụgbọ ịnyịnya Fero.+
10 Ọla ndị e ji achọ mma i yi* mere ka ntì gị maa mma,
Ákà* ndị ị nya n’olu mekwara ka olu gị maa mma.
11 Anyị ga-eji ọlaedo rụọrọ gị ọla e ji achọ mma,
Jirikwa ọlaọcha chọọ ha mma.”
15 “Onye m hụrụ n’anya, ị mara mma.
Ị mara ezigbo mma. Anya gị dị ka anya nduru.”+
16 “Onye m hụrụ n’anya, ị mara mma.* Ị mara ezigbo mma.+
Anyị na-edina ala n’akwụkwọ ndụ.