Job
25 Bildad+ onye Shua kwuru, sị:
2 “Ọ bụ ya nwe ọchịchị, ọ dịkwa egwu.
Ọ na-eme ka udo dịrị n’eluigwe.*
3 À na-agụtali ndị agha ya ọnụ?
È nwere onye ìhè ya na-anaghị enwuru?
4 Oleezi otú mmadụ efu ga-esi bụrụ onye ezi omume n’anya Chineke,+
Ma ọ bụ, olee otú onye nwaanyị mụrụ ga-esi bụrụ onye aka ya dị ọcha?+
5 Ọnwa anaghịdị etisi ike n’anya ya,
Kpakpando adịghịkwa ọcha n’anya ya,
6 Ma ya fọdụzie mmadụ efu bụ́ ikpuru
Nakwa nwa nke mmadụ bụ́ idide.”