Abụ Ọma
Ka m jiri obi m niile too Jehova.+
2 M ga-eto Jehova ná ndụ m niile.
M ga-abụku Chineke m abụ otuto n’oge niile m dị ndụ.
3 Unu atụkwasịla ndị isi* obi,
Unu atụkwasịkwala nwa nke mmadụ obi, bụ́ onye na-enweghị ike ịzọpụta mmadụ.+
4 Ọ kwụsị iku ume, ọ na-alaghachi n’ájá.+
N’ụbọchị ahụ, ọ na-akwụsị iche echiche.+
5 Onye Chineke Jekọb na-enyere aka na-enwe obi ụtọ,+
Bụ́ onye nwere olileanya n’ebe Chineke ya bụ́ Jehova nọ,+
6 Onye kere eluigwe na ụwa,
Oké osimiri na ihe niile dị n’ime ha,+
Onye e kwesịrị ịtụkwasị obi mgbe niile,+
7 Onye na-ekpechitere ndị a na-erigbu erigbu ọnụ ha,
Onye na-enye ndị agụụ na-agụ ihe oriri.+
Jehova na-atọhapụ ndị mkpọrọ.*+
8 Jehova na-emeghe anya ndị ìsì.+
Jehova na-ekulite ndị ike gwụrụ.+
Jehova hụrụ ndị ezi omume n’anya.
9 Jehova na-echebe ndị mbịarambịa.
Toonụ Jaa!*