Hosia
2 Lọghachikwutenụ Jehova. Sịkwanụ ya:
‘Gbaghara anyị mmehie anyị,+ nabatakwa ihe dị mma anyị na-enye gị.
Anyị ga-ejikwa ọnụ anyị too gị+ otú ahụ anyị si eji ụmụ ehi achụrụ gị àjà.*
3 Asiria agaghị azọpụta anyị.+
Anyị agaghị agba ịnyịnya.+
Anyị agaghịzi asị aka ọrụ anyị, “Ị bụ Chi anyị.”
N’ihi na ọ bụ gị na-emere nwa na-enweghị nna ebere.’+
4 M ga-agwọ ha.+ Ha agaghịzi ahapụ m.
5 M ga-adịrị Izrel ka igirigi.
Ọ ga-awa okooko dị ka lili,
Gbanyesiekwa mgbọrọgwụ ike dị ka osisi Lebanọn.
6 Ọ ga-awa alaka.
Ọ ga-adị ebube ka osisi oliv.
Ọ ga na-esikwa ísì ọma dị ka osisi Lebanọn.
7 Ha ga-ebi ọzọ na ndò ya.
Ha ga-akụ ọka,* ha ga-amakwa ifuru dị ka osisi vaịn.+
Ndị mmadụ ga-akọ gbasara ya otú ha si akọ gbasara mmanya Lebanọn.*
8 Ifrem ga-asị, ‘Gịnị ka gbasara mụ na arụsị?’+
M ga-anụ olu ya, lekọtakwa ya.+
M ga-adị ka osisi junipa nke akwụkwọ ndụ juru n’elu ya.
Ọ bụ m ga-amịrị ya mkpụrụ.”
9 Ka onye ma ihe ghọta ihe ndị a.
Ma ndị na-emebi iwu ga na-adagharị, sikwa na ya kpafuo.