Job
18 Bildad+ onye Shua kwuru, sị:
2 “Olee mgbe unu* ga-akwụsị ụdị okwu a unu na-ekwu?
Gositụnụ na unu na-aghọta ihe ka anyị nwee ike ikwu okwu.
4 Ọ bụrụgodị na iwe ị na-ewe emee ka ị dọrie onwe gị,*
À ga-agbapụrụ gị n’ụwa,
Ka oké nkume ọ̀ ga-esi n’ebe ọ dị pụọ?
8 N’ihi na ụkwụ ya ga-eduba ya n’ụgbụ.
Ọ ga-agara banye na ya.
9 Ọnyà ga-ama ya n’ikiri ụkwụ.
Ọnyà ga-ejide ya.+
10 E zoro ụdọ n’ala ka e jiri ya jide ya,
E sikwara ọnyà n’ebe o si agafe.
12 Ike na-agwụ ya,
Ọdachi+ ga-emekwa ka ọ na-adagharị.*
13 Ọrịa na-eri akpụkpọ ahụ́ ya.
Ọrịa kacha njọ na-erichapụ aka ya na ụkwụ ya.
14 A ga-esi n’ụlọikwuu ya, bụ́ ebe obi ruru ya ala, kpụpụta ya+
Kpọgara ya eze kacha emenye mmadụ ụjọ.*
15 Ndị ọbịa* ga-ebi n’ụlọikwuu ya.
16 Mgbọrọgwụ ya ga-akpọ nkụ n’ime ala,
Alaka ya ga-akpọnwụkwa.
18 A ga-esi n’ìhè chụba ya n’ọchịchịrị,
A ga-achụpụkwa ya n’ụwa.
20 N’ụbọchị ọdachi ga-adakwasị ya, akpata oyi ga-awụ ndị nọ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ,
Egwu ga-ejidekwa ndị nọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ.
21 Ọ bụ ihe na-eme ụlọikwuu onye na-eme ihe ọjọọ,
Ọ bụkwa ihe na-eme ụlọ onye na-amaghị Chineke.”