1 Aha Chineke n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nakwa n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst
“Jehova.” Hibru, יהוה (YHWH ma ọ bụ JHVH)
“Jehova” (Hib., יהוה, YHWH), bụ́ aha Chineke, pụtara nke mbụ ya na Je 2:4. Aha Chineke bụ ngwaa, nke na-egosi ime ihe, ụdị ngwaa Hibru bụ́ הוה (ha·wahʹ, “ịghọ”), nke na-egosi ihe a ka na-eme eme. Ya mere, aha Chineke pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ.” Nke a na-egosi na Jehova bụ Onye na-eme onwe ya ka ọ ghọọ Onye na-emezu nkwa ya, Onye na-eme ka nzube ya mezuo mgbe niile, site n’ịnọgide na-arụ ọrụ.
Mkparị kasị njọ ndị nsụgharị nke oge a na-akparị Chineke Onye Chepụtara Akwụkwọ Nsọ bụ mwepụ ha wepụrụ aha ya pụrụ iche, zochiekwa ya. N’ezie, aha ya pụtara puku ugboro isii, narị asatọ na iri abụọ na asatọ n’ihe e dere n’asụsụ Hibru dị ka יהוה (YHWH ma ọ bụ JHVH), bụ́ nke a na-akpọkarị Tetragramatọn (nke pụtara “o nwere mkpụrụ akwụkwọ anọ,” ma e kwuo ya n’ụzọ nkịtị). Site n’idenye aha ahụ bụ́ “Jehova,” anyị gbasoro ihe e dere n’asụsụ mbụ e ji dee Akwụkwọ Nsọ, anyị agbasoghịkwa omenala nke iji utu aha ndị dị ka “Onyenwe anyị,” “Adonai” ma ọ bụ “Chineke” dochie aha Chineke, ya bụ, Tetragramatọn ahụ.
Aha ahụ bụ́ “Jehova” pụtara puku ugboro isii, narị itoolu na iri asaa na atọ n’ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ. N’ezie, Tetragramatọn pụtara puku ugboro isi, narị asatọ na iri abụọ na asatọ n’ihe e dere n’asụsụ Hibru, tinyere aha atọ aha ahụ dị na ha (Je 22:14; Ọp 17:15; Ikp 6:24), ọ pụtakwara ugboro isii n’okwu mmeghe e dere n’Abụ Ọma (7; 18 [ugboro atọ]; 36; 102). Anyị sụgharịrị Tetragramatọn ahụ “Jehova” n’ebe niile ọ pụtara, nke dị puku isi, narị asatọ na iri abụọ na asatọ ma e wezụga ná Ndị Ikpe 19:18, bụ́ ebe e dere nnọchiaha nke na-egosi otu onye, ya bụ, “m,” kama ide aha Chineke. Anyị dabeere n’ihe e dere na Septuagint wee weghachi Tetragramatọn ahụ na Di 30:16; 2Sa 15:20 nakwa na 2Ih 3:1. Anyị weghachikwara aha Chineke n’Aịz 34:16 nakwa na Zek 6:8, bụ́ ebe ndị e kwesịrị idenye “Jehova” kama idenye nnọchiaha nke na-egosi otu onye, ya bụ, “m.” E weghachiri ya n’ebe ndị ọzọ dị otu narị na iri anọ na otu, bụ́ ebe ndị Soferim gbanwere aha Chineke ka ọ bụrụ ʼAdho·naiʹ ma ọ bụ ‘Elo·him.’
Ka anyị wee ghara ịhapụ ọrụ anyị dị ka ndị nsụgharị wee mewe nkọwa, anyị kpachaara nnọọ anya n’ịsụgharị aha Chineke n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, jiri nlezianya were Akwụkwọ Nsọ Hibru mere ihe ndabere. Anyị achọtawo ihe ndị kwadoro nke a n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ndị e nwere n’asụsụ Hibru iji jide n’aka na nsụgharị anyị ziri ezi.
E dere Tetragramatọn ahụ ná mkpụrụ akwụkwọ ndị Hibru (יהוה) ma n’ihe e dere n’asụsụ Hibru ma na Septuagint Grik. Ya mere, ma Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya hà gụrụ Akwụkwọ Nsọ e dere n’asụsụ Hibru ma ọ bụ n’asụsụ Grik, ha gụtara aha Chineke. Mgbe Jizọs guzooro ọtọ n’ụlọ nzukọ dị na Nazaret wee nara akwụkwọ Aịzaya ma gụọ 61:1, 2, bụ́ ebe Tetragramatọn ahụ dị, ọ kpọrọ aha Chineke. Nke a kwekọrọ ná mkpebi o mere ime ka a mara aha Jehova dị ka a pụrụ ịhụ n’ekpere o kpekuru Nna ya, sị: “Emewo m ka aha gị pụta ìhè nye ndị i si n’ụwa nye m. . . . Emewokwa m ka ha mara aha gị, m ga-emekwa ka a mara ya.”—Jn 17:6, 26.
Anyị edenyewo aha Chineke narị ugboro abụọ na iri atọ na asaa n’ime nsụgharị anyị nke bụ́ Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. N’ọtụtụ nsụgharị Hibru, a hụwo ebe ndị kwadoro nke ọ bụla n’ime narị ugboro abụọ na iri atọ na asaa ndị a e denyere aha ahụ n’ime nsụgharị a.