2 “Gehena”—Ihe Atụ nke Mbibi Zuru Ezu
Hibru, גי הנם (geh hin·nomʹ, “ndagwurugwu Hinọm”); Grik, γέεννα (geʹen·na); Latin, ge·henʹna
“Gehena” pụtara “ndagwurugwu Hinọm,” n’ihi na ọ bụ okwu Grik nke si n’okwu Hibru bụ́ geh hin·nomʹ. Na Jọshụa 18:16, bụ́ ebe “ndagwurugwu Hinọm” pụtara, Septuagint Grik kpọrọ ya “Gehenna.” Ọ pụtara ugboro iri na abụọ n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Ebe mbụ ọ pụtara bụ na Mt 5:22. Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ sụgharịrị ya “Gehena” n’ebe niile ọ pụtara, ya bụ, na Mt 5:22, 29, 30; 10:28; 18:9; 23:15, 33; Mk 9:43, 45, 47; Lu 12:5; Jes 3:6.
Ndagwurugwu Hinọm ghọrọ ebe a na-ekpofu unyi si na Jeruselem na ebe a na-agba ya ọkụ. A na-atụba ozu anụmanụ n’ebe ahụ ka ọkụ ree ha. A na-etinyekwa sọlfọ ma ọ bụ brimston n’ime ya iji mee ka ọkụ ahụ na-ere. A na-atụbakwa ozu ndị omempụ e gburu egbu n’ebe ahụ, bụ́ ndị a gụrụ ná ndị a na-ekwesịghị ili nke ọma n’ili ncheta. Ọ bụrụ na ozu ndị dị otú ahụ adanye n’ime ọkụ ahụ, ọkụ na-erechapụ ha, ma ọ bụrụ na ozu ha adanye n’akụkụ ndagwurugwu ahụ dị omimi, ikpuru na-atụ ozu ha na-ere ure. Ikpuru ndị ahụ adịghị anwụ ruo mgbe ha richara anụ ha, wee hapụ naanị ọkpụkpụ ha.
Ọ dịghị anụmanụ ma ọ bụ mmadụ ọ bụla dị ndụ a na-atụba n’ime Gehena ka ọkụ ree ya ná ndụ ma ọ bụ ka e mekpaa ya ahụ́. N’ihi ya, ebe ahụ apụghị ịbụ ihe atụ nke ógbè a na-adịghị ahụ anya, bụ́ ebe a na-emekpa mkpụrụ obi ụmụ mmadụ ahụ́ ruo mgbe ebighị ebi n’ọkụ nkịtị ma ọ bụ ebe ikpuru na-adịghị anwụ anwụ na-eri ha ruo mgbe ebighị ebi. Ebe ọ bụ na ndị omempụ nwụrụ anwụ ndị a tụbara n’ebe ahụ bụ ndị a na-elighị nke ọma n’ili ncheta, nke bụ́ ihe atụ olileanya mbilite n’ọnwụ, Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ji Gehena mee ihe atụ mbibi ebighị ebi, ikpochapụ ndị ọjọọ n’eluigwe na ụwa nke Chineke, ma ọ bụ “ọnwụ nke abụọ,” ntaramahụhụ ebighị ebi.