Joshụa
18 Nzukọ ụmụ Izrel dum wee gbakọọ na Shaịlo.+ Ha wee maa ụlọikwuu nzute n’ebe ahụ,+ ebe ọ bụ na e meriwo ala ahụ n’ihu ha.+ 2 Ma a ka nwere ndị fọdụrụ n’etiti ụmụ Izrel bụ́ ndị a na-ekepụtabeghị ihe nketa ha, ya bụ, ebo asaa. 3 Jọshụa wee sị ụmụ Izrel: “Ruo ole mgbe ka unu ga na-akpọ ekwo nkụ n’ihe banyere ịbanye weghara ala+ ahụ nke Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà nyere unu?+ 4 Họpụtaranụ onwe unu ndị ikom atọ n’ebo ọ bụla ka m zipụ ha, ka ha bilie gagharịa n’ala ahụ wee see ókè ya n’akwụkwọ dị ka ihe nketa ha si dị, ka ha bịakwutekwa m.+ 5 Ha ga-ekekwa ya ụzọ asaa n’etiti onwe ha.+ Juda ga-ebi n’ókèala ya n’ebe ndịda,+ ụlọ Josef ga-ebikwa n’ókèala ha n’ebe ugwu.+ 6 Ma unu ga-ese ala ahụ n’akwụkwọ ma kee ya ụzọ asaa, wetaranụ m ya ebe a, m ga-efekwara unu nza+ n’ebe a n’ihu Jehova bụ́ Chineke anyị. 7 N’ihi na ndị Livaị enweghị òkè n’etiti unu,+ n’ihi na ọrụ nchụàjà Jehova bụ ihe nketa ha;+ Gad na Ruben+ na ọkara ebo Manase+ enwetawo ihe nketa ha n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Jọdan, bụ́ nke Mozis ohu Jehova nyere ha.”+
8 Ndị ikom ahụ wee bilie ka ha gawa. Jọshụa wee nye ndị ahụ na-aga ise ala ahụ n’akwụkwọ iwu,+ sị: “Gaanụ jegharịa n’ala ahụ ma see ya n’akwụkwọ, lọghachikwutekwanụ m, ọ bụ n’ebe a ka m ga-efere unu nza+ na Shaịlo+ n’ihu Jehova.” 9 Ndị ikom ahụ wee gawa, gazuo ala ahụ ma see ya n’akwụkwọ,+ keekwa ya ụzọ asaa n’obodo n’obodo. E mesịa, ha bịakwutere Jọshụa n’ebe ha mara ụlọikwuu ha na Shaịlo, 10 Jọshụa wee feere ha nza na Shaịlo n’ihu Jehova.+ Otú ahụ ka Jọshụa si keere ụmụ Izrel ala ahụ n’ebe ahụ n’òkè n’òkè.+
11 Nza+ wee daara ebo Benjamin+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ, ókèala ha nwetara site na nza e fere wee dịrị n’agbata ala ụmụ Juda+ na ụmụ Josef.+ 12 Ókè ha n’isi isi ebe ugwu wee malite na Jọdan, ókè nke ala ahụ rukwara ná mkpọda Jeriko+ n’ebe ugwu ma gbagoo n’ugwu n’ebe ọdịda anyanwụ. Ebe o jedebere bụ n’ala ịkpa Bet-evin.+ 13 Ókè ya wee si n’ebe ahụ ruo Lọz,+ n’ebe mkpọda nke dị na ndịda Lọz, ya bụ, Betel;+ ókè ya wee gbadaa Atarọt-ada+ n’elu ugwu nke dị n’ebe ndịda nke Bet-horọn Ndịda.+ 14 E wee kpaa ókè ya, ókè ya wee gaa gburugburu n’ebe ọdịda anyanwụ ruo n’ebe ndịda, malite n’ugwu nke chere ihu na Bet-horọn n’ebe ndịda; ebe o jedebere bụ Kiriat-bel, ya bụ, Kiriat-jierim,+ bụ́ obodo ụmụ Juda. Nke a bụ ebe ọdịda anyanwụ.
15 Mpaghara ebe ndịda bidoro na nsọtụ Kiriat-jierim, ókè ya gakwara n’ebe ọdịda anyanwụ ruo n’isi mmiri Neftoa.+ 16 Ókè ya gbadara na nsọtụ ugwu nke chere ihu na ndagwurugwu nwa Hinọm,+ nke dị na ndagwurugwu Refeyim+ n’ebe ugwu. Ọ gbadakwara na ndagwurugwu Hinọm, ná mkpọda nke obodo ndị Jibọs,+ gbadaruokwa n’En-rogel.+ 17 A kpara ókè ya n’ebe ugwu. O ruru En-shimesh, ruokwa Gelaịlọt, bụ́ nke dị n’ihu ụzọ gbagoro Adọmịm;+ ọ gbadakwara ruo nkume+ Bohan+ nwa Ruben. 18 Ọ gafere ruo ná mkpọda nke dị n’ebe ugwu n’ihu Araba, gbadaruokwa Araba. 19 Ókè ya gafere ruo ná mkpọda nke dị n’ebe ugwu nke Bet-họgla,+ ebe ókè ya jedebere bụ n’ọnụ mmiri dị n’ebe ugwu nke Oké Osimiri Nnu,+ na nsọtụ ebe ndịda Jọdan. Nke a bụ ókè ebe ndịda. 20 Ókè ya nke ebe ọwụwa anyanwụ bụ Jọdan. Nke a bụ ihe nketa nke ụmụ Benjamin, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, n’ókè ya niile gbaa gburugburu.
21 Obodo niile nke ebo ụmụ Benjamin, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, bụ Jeriko+ na Bet-họgla na Imek-kiziz, 22 na Bet-araba+ na Zemarem na Betel,+ 23 na Avim na Pera na Ọfra,+ 24 na Kifa-amọnaị na Ọfnaị na Giba;+ obodo iri na abụọ na ógbè ha niile.
25 Gibiọn+ na Rema na Bierọt, 26 na Mizpe+ na Kefaịra+ na Moza, 27 na Rikem na Iyepiel na Tarala, 28 na Zila,+ Ha-ilef na Jebusi, ya bụ, Jeruselem,+ Gibia+ na Kiriat; obodo iri na anọ na ógbè ha niile.
Ọ bụ nke a bụ ihe nketa nke ụmụ Benjamin n’ezinụlọ n’ezinụlọ.+