Joshụa
17 Nza+ e fere wee daara ebo Manase,+ n’ihi na ọ bụ ọkpara Josef,+ ọ bụ Mekia+ bụ́ ọkpara Manase, nna Gilied,+ ka ọ daara n’ihi na ọ bụ dike n’agha;+ Gilied+ na Beshan wee bụrụ nke ya. 2 Nza wee daara ụmụ Manase ndị fọdụrụnụ, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, ya bụ, ụmụ Abi-iza+ na ụmụ Hilek+ na ụmụ Asriel na ụmụ Shikem+ na ụmụ Hifa na ụmụ Shemaịda.+ Ọ bụ ndị a bụ ụmụ Manase nwa Josef, bụ́ ndị ikom n’ezinụlọ n’ezinụlọ. 3 Ma Zelofehad+ nwa Hifa, nwa Gilied, nwa Mekia, nwa Manase, amụtaghị nwa nwoke, kama ọ mụrụ ụmụ nwaanyị, ndị a bụkwa aha ụmụ ya ndị inyom: Mala na Noa, Họgla, Milka na Teza.+ 4 Ha wee bịa n’ihu Elieza+ onye nchụàjà na Jọshụa nwa Nọn na ndị isi, sị: “Ọ bụ Jehova nyere Mozis iwu ka o nye anyị ihe nketa n’etiti ụmụnne anyị ndị ikom.”+ O wee nye ha ihe nketa n’etiti ụmụnne nna ha,+ dị ka iwu Jehova si dị.
5 Òkè iri laara Manase, ma e wezụga ala Gilied na Beshan, bụ́ ndị dị n’ofe Jọdan;+ 6 n’ihi na ụmụ ndị inyom Manase nwetara ihe nketa n’etiti ụmụ ya ndị ikom; ala Gilied wee bụrụ nke ụmụ Manase ndị fọdụrụ.
7 Ókè nke ala Manase wee malite n’Asha ruo Mikmitat,+ nke dị n’ihu Shikem,+ ókè ya gara n’aka nri ruo n’ebe ndị En-Tapua bi. 8 Ala Tapua+ wee ghọọ nke Manase, ma Tapua nke dị n’ókè nke ala Manase ghọrọ nke ụmụ Ifrem. 9 Ókè ya gbadakwara ruo na ndagwurugwu Kena, gbadaa n’ebe ndịda ruo na ndagwurugwu nke obodo+ Ifrem ndị a, n’etiti obodo ndị ahụ Manase nwe. Ókè nke ala Manase dịkwa n’ebe ugwu nke ndagwurugwu ahụ, ebe o jedebere bụ n’oké osimiri.+ 10 Ebe ndịda bụ nke Ifrem, ebe ugwu abụrụ nke Manase, oké osimiri wee bụrụ ókè ya;+ n’ebe ugwu, Manase ruru Asha, n’ebe ọwụwa anyanwụ, Manase ruru Ịsaka.
11 N’Ịsaka nakwa n’Asha, Manase+ nwetara Bet-shian+ na obodo nta ya niile nakwa Ibliam+ na obodo nta ya niile nakwa ndị bi na Dọọ+ na obodo nta ya niile nakwa ndị bi n’En-dọọ+ na obodo nta ya niile nakwa ndị bi na Teanak+ na obodo nta ya niile nakwa ndị bi na Megido+ na obodo nta ya niile, atọ n’ime ebe ndị dị elu.
12 Ụmụ Manase enweghịkwa ike iweghara obodo ndị a,+ kama ndị Kenan gbara isi akwara biri n’ala a.+ 13 O wee ruo na mgbe ụmụ Izrel ghọrọ ndị dị ike,+ ha mere ka ndị Kenan rụwa ọrụ mmanye,+ ha anapụghịkwa ha ala ha dum.+
14 Ụmụ Josef wee sị Jọshụa: “Gịnị mere ala i nyere anyị site n’ife nza ji bụrụ otu ala,+ gịnịkwa mere i ji kenye anyị otu ala ka ọ bụrụ ihe nketa anyị, ebe anyị dị ọtụtụ n’ihi na Jehova agọziwo anyị ruo ugbu a?”+ 15 Jọshụa wee sị ha: “Ọ bụrụ na unu dị ọtụtụ, gbagoonụ n’oké ọhịa, jirikwanụ aka unu sụọ ebe ahụ, n’ala ndị Perizaịt+ na ndị Refeyim,+ ebe ọ bụ na ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu+ abaghị unu.” 16 Ụmụ Josef wee sị: “Ógbè ahụ bụ́ ugwu ugwu agaghị ezuru anyị, ndị Kenan, bụ́ ndị bi n’ala ahụ nke dị na ndagwurugwu, nwere ụgbọ ịnyịnya agha+ ndị nwere mma, tinyere ndị bi na Bet-shian+ na obodo nta ya niile nakwa ndị bi na ndagwurugwu Jezril.”+ 17 Jọshụa wee gwa ụlọ Josef, ya bụ, Ifrem na Manase, sị: “Unu dị ọtụtụ, unu dịkwa ike nke ukwuu.+ Unu ekwesịghị inweta otu òkè,+ 18 kama ógbè ahụ bụ́ ugwu ugwu kwesịrị ịbụ nke unu.+ Ebe ọ bụ oké ọhịa, sụọnụ ya, ọ ga-abụkwa ebe ala unu ga-ejedebe. Chụpụnụ ndị Kenan, ọ bụ ezie na ha nwere ụgbọ ịnyịnya agha ndị nwere mma, bụrụkwa ndị dị ike.”+