Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • nwt Faịlimọn 1-25
  • Faịlimọn

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Faịlimọn
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Faịlimọn

AKWỤKWỌ OZI E DEGAARA FAỊLIMỌN

1 Abụ m Pọl, onye a tụrụ mkpọrọ+ n’ihi Kraịst Jizọs. Mụ na Timoti,+ bụ́ nwanna anyị, na-edetara Faịlimọn, onye anyị hụrụ n’anya na onye ọrụ ibe anyị, akwụkwọ ozi, 2 ya na Afia, nwanna anyị nwaanyị, na Akịpọs,+ onye agha ibe anyị, nakwa ọgbakọ dị n’ụlọ+ Faịlimọn:

3 Ka Chineke Nna anyị nakwa Onyenwe anyị Jizọs Kraịst meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu.

4 Ana m ekele Chineke m mgbe niile m chetara gị n’ekpere m,+ 5 n’ihi na m na-anụ gbasara okwukwe i nwere nakwa otú i si hụ Onyenwe anyị Jizọs na ndị nsọ niile n’anya. 6 Ekpere m bụ ka okwukwe gị na ndị ọzọ nwere mee ka ị ghọta ihe ọma niile anyị si n’aka Kraịst nweta. 7 N’ihi na m ṅụrịrị ezigbo ọṅụ mgbe m nụrụ otú i si hụ ndị ọzọ n’anya. O mekwara ka obi sie m nnọọ ike. Nwanna m, i meekwala ka obi sie ndị nsọ ike.

8 N’ihi ya, ọ bụ eziokwu na m nwere ike inye gị iwu n’aha Kraịst n’ezoghị ọnụ ka i mee ihe kwesịrị ekwesị, 9 ma, ọ ka mma ka m rịọ gị ka i mee ya n’ihi na ị hụrụ ndị ọzọ n’anya, ebe ị ma na mụnwa, bụ́ Pọl, emeela agadi, nakwa na a tụrụ m mkpọrọ ugbu a n’ihi Kraịst Jizọs. 10 Ana m arịọ gị ka i meere m otu ihe ọma gbasara Onesịmọs,+ onye m ji mere nwa+ ugbu a a tụrụ m mkpọrọ.* 11 Ọ baraghị gị uru n’oge gara aga, ma ọ baara mụ na gị uru ugbu a. 12 M na-ezilatara gị ya. Ọ bụ onye m hụrụ nnọọ n’anya.

13 M chọrọ ka mụ na ya nọrọ ebe a ka ọ na-ejere m ozi ị gaara ejere m ebe a a tụrụ m mkpọrọ n’ihi ozi ọma m na-ezisa.+ 14 Ma, agaghị m eme ihe ọ bụla gbasara ya ma ọ bụrụ na i kweghị, ka ọ ghara ịbụ na m manyere gị ka i meere m ihe ọma, kama, ka ọ bụrụ na i ji obi gị niile mee ya.+ 15 O nwere ike ịbụ ya mere o ji hapụtụ gị,* ka i nwee ike kpọrọghachi ya ruo mgbe ebighị ebi. 16 Ọ gaghịzi abụ naanị ohu gị,+ kama ọ ga-abụ onye karịrị ohu. Ọ ga-abụzi nwanna gị. M hụrụ ya nnọọ n’anya.+ Ma gịnwa ga-aka ahụ ya n’anya ebe ọ bụ ohu gị, bụrụkwa ohu Onyenwe anyị. 17 N’ihi ya, ọ bụrụ na m ka bụ enyi gị, nabata ya otú ị ga-esi anabata m. 18 Ọ bụrụkwa na o mere gị ihe ọjọọ ọ bụla ma ọ bụ jiri gị ụgwọ, ya dịrị m n’isi. 19 Ọ bụ mụnwa, bụ́ Pọl, ji aka m na-ede na m ga-akwụ gị ụgwọ o ji gị. Ma, gịnwa jidị m ụgwọ karịrị nke o ji gị. 20 Nwanna m, meere m ihe ọma a n’ihi Onyenwe anyị. Mee ka obi sikwuo m ike n’ihi na m na-eso ụzọ Kraịst.

21 Obi siri m ike na ị ga-eme ihe m gwara gị, ọ bụ ya mere m ji edetara gị akwụkwọ ozi a. Amakwa m na ị ga-emedị karịa ihe m gwara gị. 22 Doziekwara m ụlọ m ga-anọ ma m bịa, n’ihi na ekpere unu nwere ike ime ka a hapụ m, mụ enweekwa ike ịbịa hụ unu.+

23 Epafras,+ onye e ji mụ na ya eji n’ihi Kraịst Jizọs, na-ekele gị. 24 Mak, Arịstakọs,+ Dimas,+ na Luk,+ bụ́ ndị ọrụ ibe m, na-ekelekwa gị.

25 Ka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst meere unu amara n’ihi àgwà ọma unu na-akpa.

Na Grik, “m nọ n’agbụ.”

Na Grik, “hapụ gị ruo otu awa.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya