N’ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwere Ka Ịta Ahụhụ Dịgide?
Akụkọ ọjọọ bụ ihe a na-aghaghị ịnụ ná ndụ, ma n’ihi gịnị ka o ji jupụta ebe nile otú a? N’ihi gịnị ka e ji nwee ịta ahụhụ dị ukwuu otú a? Olee otú a pụrụ isi nọgide na-ekwere na e nwere Chineke nke na-ahụ n’anya ebe ọ nọgidere na-adị? Ọ̀ dị mgbe ọ bụla ịta ahụhụ ga-akwụsị?
A na-achọta azịza nye ndị a na ajụjụ ndị ọzọ dị mkpa n’ime Bible. Azịza ya metụtara gị na ezinụlọ gị. Ha metụtara obi ụtọ gị. Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala bụ akwụkwọ nke na-enye olileanya site n’iduru gị jee n’azịza ndị Bible na-enye.
Akwụkwọ nke a nke nwere 256 peji, nke ha na peji magazin nke a hà n’obodobo, jupụtara n’ihe karịrị 150 ihe osise ndị e ji ezi ihe, nke ọtụtụ n’ime ha dị n’àgwà ndị mara mma. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta ya, biko dejupụta ma zite mpempe akwụkwọ dị n’okpuru ebe a.
Ọ ga-amasị m ịnata akwụkwọ ahụ nwere 256 peji, nke e kwesiri mkpò ya ike, bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. (Degara adres dị n’okpuru akwụkwọ iji matakwuo ihe banyere nke a.)
[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji 32]
U.S. Army