Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Gịnị Ka M Kwesịrị Ime Ma Ọ Bụrụ na Enyi M Abaa ná Nsogbu?
Sherrie dị afọ 14 na-ekwu, sị: “Ezi enyi m si n’ịbụ onye Kraịst kpafuo. Ọ na-ewute m. Agbalịsiwo m ike ịgba ya ume!”a
ONYE gị na ya na-akpachi anya ọ̀ bawo ná nsogbu ma ọ bụ malite ịgbaso ụzọ ndụ a na-enyo enyo? “Mụ na Chris na-akpachi anya,” ka Johnny na-ekwu. “Anyị bụ ezi ndị enyi. Otu ụbọchị o si n’ụlọ gbapụ. Nke a juru m anya, ọ dịkwa m ka m nwere ibu ọrụ ịga chọọ ya. Anyara m ụgbọ ala abalị nile na-achọ ya.”
Bible dọrọ aka ná ntị na n’oge ikpeazụ, oké nrụgide ga-abịakwasị ndị mmadụ, ndị na-eto eto na ndị agadi. (2 Timoti 3:1-5) Ya mere o kwesịghị iju anyị anya mgbe site n’oge ruo n’oge onye Kraịst na-eto eto sụrụ ngọngọ. Ma mgbe o mere onye ị na-eche banyere ya, ị pụrụ inwe ụdị mmetụta uche ndị dịgasị iche iche, malite n’iru újú na ọmịiko gaa n’iwe. Ị chọrọ inyere enyi gị aka. Ma olee otú ị pụrụ isi mee otú ahụ?
‘Apụrụ M Ịzọpụta Ya’
Bible na-asị: “Onye meworo ka onye mmehie si ná njehie nke ụzọ ya chigharịa ga-azọpụta mkpụrụ obi [nke onye mmehie ahụ] n’ọnwụ, ọ ga-ekpuchikwa ọtụtụ mmehie.” (Jemes 5:20) Ma nke a ọ̀ pụtara na ime otú ahụ bụ ibu ọrụ gị? Ọ bụchaghị ya. Nne na nna enyi gị nwere ibu ọrụ mbụ n’ebe ọ nọ. (Ndị Efesọs 6:4) Bible na-ekwukwa ná Ndị Galetia 6:1, sị: “Ụmụnna m, a sị na ọ bụ ezie na a nwụde mmadụ mgbe ọ nọ ná ndahie ọ bụla, unu onwe unu, bụ́ ndị Mmụọ Nsọ na-achị, meenụ ka mmadụ dị otú a guzozie n’ime mmụọ nke ịdị nwayọọ.” Ndị okenye ọgbakọ ruru eru karịsịa n’ọnọdụ a. Ha si otú ahụ nọrọ n’ọnọdụ ka mma inye aka karịa otú ị nọ.
Ị ghaghị ịghọta na dị ka onye na-eto eto, i nwere ahụmahụ a kpaara ókè ná ndụ. (Tụlee Ndị Hibru 5:14.) Ya mere jiri obi umeala nakwere erughị eru ndị i nwere n’ọnọdụ a, zerekwa itinye aka n’ọrụ karịrị gị. (Ilu 11:2) Tụlee onye ntorobịa aha ya bụ Rebekah. Ọ gbalịrị inyere enyi ya nwoke aka, bụ́ onye ikwu ya, nke tinyeworo aka n’ọgwụ ọjọọ. Ọ na-akọ, sị: “Ihe tụkwasịrị m nrụgide bụ na ọ na-akọrọ m ihe, ma ghara ịkọrọ nne na nna ya. Agbalịrị m inyere ya aka, ma ọ bụ ihe na-akụda mmụọ nke ukwuu. Ọ bụụrụ m ihe enyemaka mgbe m ghọtara n’ikpeazụ na ọ dịghị ihe m pụrụ ime . . . Apụghị m ịbụ onye nzọpụta ya.” Rebekah gbaziri ya ume inweta enyemaka site n’aka ndị meworo okenye ruru eru.
Matthew na-eto eto nọ n’ọnọdụ yiri ya, ma ọ nakweere erughị eru ya nile ná mmalite. Ọ na-ekwu banyere otu enyi ya ihe na-enye nsogbu, sị: “Ọ ga-eji nsogbu ya bịakwute m, ma m ga-agwa ya ka ọ gakwuru nne na nna ya. Amatara m na mụ ekwesịghị iburu nsogbu ya.”
Otú Ị Pụrụ Isi Nye Aka
Nke a apụtaghị na ị pụghị ime ihe ọ bụla iji nye aka. Ọ dabeere n’ụzọ dị ukwuu n’ọnọdụ ndị dịnụ. Ọ pụrụ ịbụ na enyi gị chọrọ ịdị na-agwa gị ihe nzuzo. Dị ka ihe e bu pụta ụwa si dị, i kwesịrị inye ya nkwado ma gee ya ntị. (Ilu 18:24; 21:13) Ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ na ọ malitewo ịgbaso ụzọ ndụ a na-enyo enyo. Ọ ga-ekwesị ekwesị ibute ụzọ ma gwa ya na n’agbanyeghị na ị na-echegbu onwe gị banyere ya, ị pụghị ikwenyere ihe ọ na-eme.
Ọnọdụ ọzọ pụrụ imetụta enyi nke kwetara na ya mere oké ihe ọjọọ. Ọ pụrụ ọbụna ịgbalị ime gị ka i kwe nkwa na ị gaghị agwa onye ọ bụla. Ma Bible na-asị: “Esokwala ndị ọzọ nwekọọ mmehie ha: debe onwe gị ọcha.” (1 Timoti 5:22) Ọ bụrụ na enyi gị na-arịasi ọrịa ike ma nwee mkpa enyemaka nlekọta ọgwụ, ị́ gaghị esi ọnwụ ịkpọga ya na nke onye dọkịta? N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na ọ dabawo n’oké ihe ọjọọ, enyemaka ime mmụọ dị ya mkpa. Ịnọgide na-ezobe okwu ahụ pụrụ igbu ya n’ụzọ ime mmụọ—metụtakwa ọgbakọ n’ụzọ dị njọ. Ya mere i nwere ibu ọrụ ịhụ na a gwara ndị okenye ọgbakọ.—Tụlee Levitikọs 5:1.
Caroline na-eto eto weere nguzo chọrọ obi ike banyere enyi ya na-eme ihe ọjọọ nke na-aghara ndị mụrụ ya ụgha. Ọ na-asị: “Enyere m ya izu abụọ iji jekwuru ndị okenye. Ọ bụrụ na o jeghị, agwara m ya na m ga-ejekwuru ha. Nke a adịghịrị m mfe ime.” Johnny, a kpọtụrụ aha ná mmalite, gosiri ịdị ike omume yiri nke ahụ. Banyere enyi ya, Johnny na-echeta, sị: “O juru m anya ịchọpụta na ya na otu nwa agbọghọ bi. E nwere ndị ọzọ n’ebe ahụ na-aṅụ mmanya, na-esekwa siga.” Johnny gwara enyi ya ka ọ pụta n’èzí ma tụsie aro ike ka ọ chọọ enyemaka site n’aka ndị okenye nọ n’ọgbakọ.
Enyi gị pụrụ iji mgbalị gị kpọrọ ihe ma ọ bụ ghara iji ya. Bible na-agwa anyị na mgbe ụmụnne ya mere omume ọjọọ, nwa okorobịa ahụ bụ́ Josef “wee wetara nna ha akụkọ ihe ọjọọ ha.” O doro anya na nke a emeghị ka ụmụnne ya nwekwuo mmasị n’ebe ọ nọ. N’ezie, “ha wee kpọọ ya asị.”—Jenesis 37:2-4.
Ọ̀ Bụ Ịkpa Àgwà Ka A Ga-asị na Ọ Dịghị Ihe Merenụ?
Otú ọ dị, ị ga-emebi mgbalị ị na-eme inye aka ma ọ bụrụ na ị nọgide na-esoro enyi gị na-akpakọrịta dị ka à ga-asị na ọ dịbeghị ihe merenụ. Ná 1 Ndị Kọrint 15:33, Pọl onyeozi dọrọ ndị Kraịst aka ná ntị megide isoro ndị na-eme ihe ọjọọ na-akpakọrịta. Isoro mmadụ ndị dị otú ahụ na-akpachi anya pụrụ nanị ịdọtụ gị n’ala!
Mollie na-eto eto mụtara nke a n’ụzọ siri ike mgbe enyi ya bụ́ Sally malitere iyi oge na nzuzo. Ọ bụghị nanị na Sally erughị eru ma ọlị ịlụ di kama o sooro ụmụ okoro na-abụghị ndị Kraịst na-eyi oge. Mollie leghaara ọnọdụ ahụ anya ma nọgide na-esoro enyi ya na-akpakọrịta. Gịnị si na ya pụta? Mollie na-asị: “Ka oge na-aga, Sally dokwara ka mụ na otu nwa okoro onye ụwa zute, anyị yikwara oge mkpapụ.” N’ụzọ ezi ihe ndaba, Mollie nwetara enyemaka site n’aka ndị okenye ọgbakọ tupu ọnọdụ ahụ adị njọ karị.
Lynn n’otu aka ahụ nakweere ihe ndị dị ize ndụ iji mee ka ọbụbụenyi ya na nwa agbọghọ aha ya bụ Beth dịgide. “Echere m na m pụrụ ịgbapụta ya,” ka Lynn na-echeta, “ma o kweghị omume. Esooro m ya na-aga disko. Amatara m na o zighị ezi, ma achọghị m ka iwe wee ya. Nsogbu ya malitere ịnyịgbu m. Agbachiri m nkịtị banyere okwu ahụ, na-eche na nsogbu ahụ ga-apụ n’anya, ma o buwanyere ibu.” Ọdachi mere ka Lynn teta n’ụra. Nwa okoro ahụ ya na Beth enyi ya na-eyi oge gburu ya.
Ịrapara n’ahụ enyi pụrụ ịda ụda ka echiche magburu onwe ya. Ma ọ bụrụ na mmiri na-ekwosi ekwo ike na-eri enyi gị n’ụzọ nkịtị, ị̀ ga-amaba n’ime ya n’onwe gị? Nke ahụ pụrụ nanị igbu unu abụọ. Ihe ezi uche dị n’ime ya ime bụ ịtụpụrụ ya ihe pụrụ ịzọpụta ndụ ya. N’otu aka ahụ, ọ dị gị mkpa inyere ya aka site n’ebe dịtere anya.—Jud 22, 23.
Ịnọrọ n’ebe dịtere anya dị oké mkpa ma ọ bụrụ na a chụpụrụ enyi gị n’ọgbakọ. Iwu Bible bụ ka gị na onye ahụ “ghara imekọ ihe.” (1 Ndị Kọrint 5:11) Ka ị ka na-echegbu onwe gị banyere onye ahụ, ị pụrụ inyere ya aka kasị mma, ọ bụghị site n’isonyere ya n’ime ihe ọjọọ, kama site n’igosipụta iguzosi ike n’ihe nye Jehova. (Abụ Ọma 18:25) Nguzo gị siri ike pụrụ ịbụ kpọmkwem ihe na-akwali ya ịtụleghachi ihe ndị ọ na-eme. Nke ka mkpa, iguzosi ike n’ihe gị ga-ewetara Jehova obi ụtọ.—Ilu 27:11.
Ibu Gabigara Ókè
Otú ọ dị, mgbalị kasị mma mmadụ na-eme iji nye aka na-ada ọtụtụ mgbe. Rebekah na-echeta banyere enyi ya, sị: “Agbalịrị m ime ihe iji nyere ya aka. Ọbụna na edegaara m ya akwụkwọ ozi, ma ọ dịghị mgbe ọ zara ya.” Caroline chọpụtara na mgbe ọtụtụ ọnwa nke ịgbalị inyere enyi nke na-ekote nsogbu gasịrị, ọ “malitere inwe mmetụta nke oké ndọlị.”
Ọ dị mkpa ịghọta na “onye ọ bụla n’etiti anyị ga-aza ajụjụ banyere onwe ya nye Chineke.” (Ndị Rom 14:12) N’agbanyeghịkwa na o kwesịrị ekwesị inyere mmadụ aka iburu ibu arọ ya, ma ọ bụ nsogbu onwe onye ya, site n’inye enyemaka dị irè, ị pụghị nnọọ iburu “ibu” onye ọzọ—ya bụ, ibu ọrụ ya n’ebe Chineke nọ. “Mmadụ nile n’otu n’otu ga-ebu ibu nke aka ha,” ka Bible na-ekwu. (Ndị Galetia 6:5) Nhọrọ ndị enyi gị na-eme adịghị n’ubu gị.
N’agbanyeghị nke ahụ, ikiri enyi gị ka ọ na-ala ndụ ya n’iyi na-egbu mgbu. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Mike na-ekwu banyere enyi ya funahụrụ ya, sị: “O mere ka m nwee oké mwute. Mụ na Mark na ndị mụrụ ya kpachiri anya nke ukwuu. Enwetụrụ m ịda mbà n’obi.”
Ọ bụ nnọọ ihe ebumpụta ụwa inwe mwute n’ihi mfu dị otú ahụ. Otú ọ dị, isoro onye ị tụkwasịrị obi na-ekwurịta banyere mmetụta gị pụrụ inye aka. (Ilu 12:25) “Site n’enyemaka nne na nna m,” ka Rebekah na-ekwu, “enwere m ike imeri ya.” Ị pụkwara ịwụpụ mmetụta gị dị ka mmiri nye Jehova Chineke n’ekpere. (Abụ Ọma 62:8) Caroline na-achịkọta ọnọdụ ahụ nke ọma site n’ikwu, sị: “Ikpegara Jehova ekpere na ime nkwusa gwa ndị ọzọ nyeere m aka nke ukwuu. Esokwara m ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-akpachi anya, karịsịa ndị inyom meworo agadi. Emesịrị m ghọta na ndị mmadụ ga-aza ajụjụ maka omume ha, na ọ dịkwa m mkpa ịga n’ihu ná ndụ m.” Site n’ime ihe ndị ahụ nile, ị ghaghị inyere onwe gị aka. Ị pụkwara nnọọ inyere enyi gị na-eme ihe ọjọọ aka n’otu aka ahụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A gbanwewo aha ụfọdụ.
[Foto dị na peeji nke 13]
Gbaa enyi gị ume inweta enyemaka