Ụwa Agha Na-adịghị Dị Nso
LEE anya ọzọ n’amụma Bible ahụ dị n’Aịsaịa nke na-asị: “Ha ga-akpụgharị mma agha ha ịghọ mma ogè, na ube ha ịghọ mma ịkwa osisi: mba agaghị eweli mma agha megide mba, ha agaghịkwa amụta agha ọzọ.” Rịba ama site n’okwu ndị gbara ya gburugburu na ndị na-akpụgharị mma agha ha ịghọ mma ogè bụ “ọtụtụ ndị mmadụ” ndị na-eje ije n’ụzọ nile nke Chineke. (Aịsaịa 2:2-4, King James Version) Nke a pụtara na ndị a na-efe Jehova Chineke ofufe, na-eruberekwa iwu ya isi. Ole ndị ka ha bụ?
Ha aghaghị ịbụ ndị na-asụ ọtụtụ asụsụ, ndị na-abụghị nanị na ha jụrụ ngwá agha kama ndị rụworo ọrụ iji wepụsịa n’uche na n’obi ha àgwà na omume ndị na-eduje n’ọgba aghara na ịlụ agha. (Ndị Rom 12:2) Kama igbu onye agbata obi ha, ha hụrụ ya n’anya. (Matiu 22:36-39) Ị̀ nụwo banyere ndị mmadụ dị otú ahụ?
Ikekwe ị nụwo na Ndịàmà Jehova na-anụ ụtọ òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ, na ha ajụwokwa iweli ngwá agha iji gbuo ndị ọzọ. Chee echiche banyere ya: Ọ bụrụ na mmadụ nile n’elu ụwa nwere otu echiche ahụ, ọ̀ bụ na mbara ụwa a agaghị abụworị ebe udo na ịnọ ná ntụkwasị obi?
N’ezie, ọ bụghị mmadụ nile nwere otu echiche ahụ. Ọ bụ dị ka Eze Solomọn dere ihe dị ka 3,000 afọ gara aga: “Mụ onwe m wee laghachi hụ mmegbu nile a na-emegbu n’okpuru anyanwụ: ma, lee, anya mmiri nke ndị a na-emegbu, ma ọ dịghị onye nkasi obi ha nwere; ma n’akụkụ ndị na-emegbu ha ka ike dị.”—Eklisiastis 4:1.
Òkù A Na-akpọ Ndị Hụrụ Udo n’Anya
Ọ̀ dị mgbe a ga-enwe ụwa agha na-adịghị? Ee. Ọ̀ ga-abịa site ná mgbalị nke ụmụ mmadụ? Ee e. Ọ̀ ga-abịa site n’ịtọghata ndị mmadụ n’ìgwè gaa n’ezi okpukpe? Ee e. Akwụkwọ Bible bụ́ Abụ Ọma na-aza, sị: “Jeenụ, hụ ọrụ nile nke Jehova . . . [Ọ] na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.)—Abụ Ọma 46:8, 9.
Olee otú Jehova Chineke ga-esi mee nke ahụ? Akwụkwọ Ilu na-aza, sị: “Ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ndị zuru okè ga-afọdụkwa n’ime ya. Ma ndị na-emebi iwu [ndị na-adịghị eji iwu Chineke akpọrọ ihe] ka a ga-ebipụ n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-efopụ na ya.”—Ilu 2:21, 22.
Otu ihe bụ isi mere na Chineke emebeghị ihe tupu ugbu a bụ nke a: Ọ na-enye ndị mmadụ ohere ịmụta banyere ụzọ ya ka ha wee nwee ike ije ije n’okporo ụzọ ya. Pita onyeozi dere, sị: “Onyenwe anyị anọghị ọdụ n’ime nkwa Ya, dị ka ụfọdụ na-agụ ya na ọ bụ ịnọ ọdụ; kama Ọ na-atachiri unu ogologo ntachi obi, n’ihi na O zubeghị ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị.” (2 Pita 3:9) N’ihi ya, ndị Chineke ji achọghị ọdịmma onwe onye nanị enyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere Jehova. Dị ka Aịsaịa si kwuo ya, ha na-akpọ òkù, sị: “Bịanụ, ka anyị rịgoruo ugwu Jehova, . . . Ọ ga-ezikwa anyị ụzọ Ya ụfọdụ.”—Aịsaịa 2:3.
‘Ikpeazụ nke Ụbọchị Ndị A’
Akụkụ akwụkwọ nsọ dị n’Aịsaịa bukwara amụma na izi ndị mmadụ ihe n’ụzọ nile nke udo ga-ewere ọnọdụ “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a.” (Aịsaịa 2:2) Anyị na-ebi n’ime oge ahụ ugbu a. N’ụzọ na-eju anya, agha nile nke narị afọ a na-egosi na anyị nọ n’oge ahụ.
Mgbe ndị na-eso ụzọ Jisọs jụrụ ya ihe ga-aka ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a akara, o buru amụma na “oké ala ọma jijiji, . . . oké ụnwụ na ajọ ọrịa na-efe efe ga-adịkwa n’ebe dị iche iche.” (Luk 21:11; Matiu 24:3) O kwukwara, sị: “Mgbe ọ bụla unu ga-anụ okwu agha dị iche iche na aghara dị iche iche, unu atụla ụjọ: n’ihi na ihe ndị a aghaghị ibu ụzọ pụta; ma ọgwụgwụ ihe nile adịghị eru ngwa ngwa. Mgbe ahụ Ọ sịrị ha, Mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ.”—Luk 21:9, 10.
Ọ bụ ezie na e nwewo agha dị iche iche eri ọtụtụ puku afọ, narị afọ a nanị ahụwo agha ụwa abụọ na, dị ka ngụkọ ụfọdụ si dị, ọtụtụ narị agha ndị dị nta karị n’ezie. Eziokwu ahụ bụ́ na e gbuwo ọtụtụ iri nde mmadụ n’agha dị iche iche na narị afọ a dị oké njọ. Dị ka magazin World Watch si kọọ, n’ime 2,000 afọ tupu narị afọ nke 20, ná nkezi, o were 50 afọ iji nwee otu nde mmadụ nwụrụ n’agha. N’ime narị afọ a, ná nkezi, oge o were iji nwee otu nde mmadụ nwụrụ n’agha bụ otu afọ.
Ụwa Agha Na-adịghị
Agha ndị jọgburu onwe ha nke narị afọ anyị, tinyere ọtụtụ ihe omume ndị ọzọ e buru ụzọ kwuo n’amụma Bible, na-egosi na anyị nọ na nso nso ụwa ọhụrụ nke Chineke ga-eme. A ga-ekpochapụ ọgba aghara nke ụwa ochie, bụ́ nke a ga-eji “ụwa ọhụrụ” dochie anya ya, ebe udo na ezi omume ga-enwe mmeri. (2 Pita 3:13) Okwu Chineke na-ekwu, sị: “A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ: ma ndị na-ele anya Jehova, ndị ahụ ga-enweta ala. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”—Abụ Ọma 37:9, 11.
N’ụwa nile taa, nde mmadụ a na-apụghị ịgụta ọnụ na-atụ anya ụwa agha na-adịghị. Igosi na Chineke aghaghị imezu nkwa ya nke ike ụwa dị otú ahụ, otu onye amụma Chineke n’oge dị anya gara aga dere, sị: “Ọhụụ ahụ na-adịru mgbe a kara aka, ọ na-ekusikwara ọgwụgwụ ya ume ike, ọ gaghị ekwukwa okwu ụgha: ọ bụrụ na ọ laa azụ, chere ya; n’ihi na ọ ghaghị ịbịa, ọ gaghị anọ ọdụ.”—Habakuk 2:3.
Ya mere, jiri amamihe tụkwasị Chineke obi ma nụ ụtọ mmezu nke nkwa ya: “Chineke Onwe ya ga-anọnyekwara [ndị ya]. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 17, 18]
Ihe Bible Na-ekwe ná Nkwa Maka Ụwa Ọhụrụ Ahụ:
E Nweghị Mpụ, Ime Ihe Ike, Ma Ọ Bụ Ajọ Omume
“[Chineke] na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa.”—Abụ Ọma 46:9.
“A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ . . . Ma ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa.”—Abụ Ọma 37:9, 10.
Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ Ga-adị n’Udo
“A mụworo anyị otu nwa, otu nwa nwoke ka e nyeworo anyị; ịbụ onyeisi ga-adịkwasịkwa n’ubu ya: a ga-akpọkwa aha ya . . . Onyeisi Udo. Ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla ịba ụba nke ịbụ onyeisi Ya na udo Ya ga-agwụ.”—Aịsaịa 9:6, 7.
Ụwa Nile Abụrụ Paradaịs
Jisọs sịrị: “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.”—Luk 23:43.
“Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29.
Òtù Ụmụnna Zuru Ụwa Ọnụ Na-ahụ n’Anya
“Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu Ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.”—Ọrụ 10:34, 35.
Mbilite n’Ọnwụ nke Ndị A Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ
“Oge hour na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili ga-anụ olu [Jisọs], ha ga-apụtakwa.”—Jọn 5:28, 29.
Ọrịa, Ịka Nká, Ma Ọ Bụ Ọnwụ Adịkwaghị
“Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.” —Mkpughe 21:4.