Nnwere Onwe Ikwu Okwu—À Na-emetọ Ya?
Ọ FỌRỌ nke nta ka ọnụ ụzọ nke narị afọ nke 21 meghee. Obi abụọ adịghị ya na narị afọ ọhụrụ ga-eweta olileanya, nchepụta, akparamàgwà, atụmanya nke nkà na ụzụ ndị dị ịtụnanya, na ọchịchọ maka nnwere onwe ka ukwuu. Ka ọ dị ugbu a, echiche mbụ nke ọchịchị, okpukpe, na nke ụmụ mmadụ na-enye ohere maka echiche na ọchịchọ ndị ọhụrụ. N’ọtụtụ ebe, ihe a na-achọsi ike bụ ka e wepụ mgbochi ndị e nwere ná nnwere onwe ikwu okwu, n’agbanyeghị ihe ndị si na ya apụta!
Ihe ndị na-agbasa ozi na redio na telivishọn na ndị na-enyocha ihe mmepụta ndị ọhụrụ katọrọ na mbụ ma machibido iwu—okwu rụrụ arụ na ihe omume na mmegharị ahụ ndị na-akpali agụụ mmekọahụ—bụzi ihe juru ebe nile n’ọtụtụ mba, bụrụkwa nke e zochiri n’aha nnwere onwe ikwu okwu!
Ndị nwere nkà n’iji kọmputa eme ihe, ma ụmụntakịrị ma ndị toworo eto, pụrụ ugbu a ibuga ihe osise nke omume mmekọahụ rụrụ arụ na kọntinent ndị ọzọ n’ime kịmkịm ole na ole, sorokwa ndị a maara na ha na-ada iwu mmekọahụ na ndị na-emetọ ụmụaka n’ụzọ mmekọahụ na-akparịta ụka, bụ́ ndị na-ajụ maka aha na adres nke ebe nzukọ ndị zoro ezo. Kwa ụbọchị ugbu a, a na-anụ egwú ndị nwere okwu ndị na-atụ aro ma na-agba ume igbu onwe onye na igbu ndị nne na nna, ndị uwe ojii, na ndị ọrụ gọọmenti na redio na telivishọn, ma ọ bụ na rekọd ụmụaka na-akpọ.
Ole na ole ná ndị ahụ na-achọ nnwere onwe ikwu okwu a na-akparaghị ókè agaghị ekwenyere Ọkàikpe Oliver Wendell Holmes, Jr., nke Ụlọikpe Kasị Elu bụ́ onye dere n’ihe karịrị ọkara otu narị afọ gara aga n’otu mkpebi a ma ama nke wetara mgbanwe banyere nnwere onwe ikwu okwu, sị: “Nchebe kasị ike nke nnwere onwe ikwu okwu agaghị echebe mmadụ ka o wee tie mkpu ọkụ n’ụzọ ụgha n’ime ụlọ ihe nkiri ma na-akpata ọgba aghara.” Ihe na-esi n’omume dị otú ahụ apụta doro anya. Mgbe ahụ, lee ka o si bụrụ ihe ezi uche na-adịghị na ya nye otu ndị a ịghara iji ahịrịokwu nke sochiri mkpebi ahụ kpọrọ ihe, jirikwa isi ike na-enupụrụ ya isi. “Ihe bụ isi n’okwu nile,” ka Holmes kwuru, “bụ ma e ji okwu ndị e kwuru mee ihe n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, bụrụkwa nke dị n’ụdị nke pụrụ ịkpata ihe ize ndụ doro anya nke dịkwa adị nke na ha ga-akpata ihe ọjọọ pụtara ìhè nke Òtù Na-eme Iwu nwere ikike igbochi.”
Ihe Na-akpali Agụụ Mmekọahụ na Kọmputa
“Mmekọahụ dị ebe nile n’ụbọchị ndị a,” ka magazin bụ́ Time kọrọ, “n’akwụkwọ, magazin, ihe nkiri, telivishọn, vidio egwú na foto mkpọsa ihe isi ụtọ na-adị n’ebe ụgbọala na-akwụsịtụ. A na-ebi ya na kaadị achụmnta ego ihe na-akpali agụụ mmekọahụ a na-anụ na fon bụ́ ndị a na-afanye n’okpuru ihe na-ehicha mmiri n’enyo ụgbọ ala. . . . Ihe ka ọtụtụ ná ndị America abụrụwo ndị ihe ngosi ihu ọha nke na-akpali agụụ mmekọahụ maara ahụ—na arụmụka na-akwado ihe mere o ji nwee ọnọdụ pụrụ iche n’okpuru Mmegharị Mbụ ahụ [nnwere onwe ikwu okwu]—nke na ọ na-esiri ha ike ịmata na ọ dị n’ebe ahụ.” Otú ọ dị, e nwere ihe dị ná njikọ nke e jikọrọ mmekọahụ pụtara ìhè na kọmputa nke wetaworo akụkụ na ihe ọhụrụ okwu ahụ bụ́ “ihe na-akpali agụụ mmekọahụ” pụtara. Ọ ghọwo ihe a ma ama, ihe zuru ebe nile, na ihe zuru ụwa ọnụ n’ọ̀tụ̀tụ̀.
Dị ka otu ihe ọmụmụ na-egosi, e nwetara ndị na-atụ ụtụ usoro bọọdu nzipụ ozi kọmputa maka ndị toworo eto, bụ́ ndị dị njikere ịkwụ ụgwọ kwa ọnwa malite na $10 ruo $30, n’ihe “karịrị 2,000 obodo ukwu n’ime 50 steti nile na 40 mba, ókèala na ógbè n’ụwa nile—tinyere mba ụfọdụ ndị dị ka China, bụ́ ebe inwe ihe na-akpali agụụ mmekọahụ bụ mmebi iwu na-eweta ọnwụ.”
Magazin bụ́ Time kọwara otu ụdị nke ihe na-akpali agụụ mmekọahụ na kọmputa dị ka “ihe yiri akpa nke ihe ‘na-ekwesịghị ekwesị’ nke na-agụnye ihe oyiyi nke ike agbụ, inweta ụtọ mmekọahụ site ná mmerụ ahụ, ịnyụkwasị mmadụ mamịrị, ịnyụkwasị mmadụ nsị, na inwe mmekọahụ n’ogige jupụtara n’ụmụ anụmanụ.” Mpụta nke ihe ndị dị ka nke a n’usoro njikọ kọmputa ọha na eze, nke ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị pụrụ inweta gbaa ụwa gburugburu, na-ewelite ajụjụ ndị siri ike banyere mmetọ a na-emetọ nnwere onwe.
“Ozugbo ụmụntakịrị nwetara ya,” ka otu akwụkwọ akụkọ Britain kwuru, “ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ jọgburu onwe ya abụghị ihe a kpaara ókè maka ebe ndebe akwụkwọ ndị nta akụkọ, n’ụzọ kwere omume, ọ dị n’ebe aka nwantakịrị ọ bụla pụrụ iru ya, nke ahụ pụtakwara n’ebe nzuzo nke ọnụ ụlọ ihi ụra.” A na-ebu amụma na a ga-akwụnye 47 pasent nke ezinụlọ nile nwere kọmputa na Britain n’usoro njikọ kọmputa ka ọ na-erule ná ngwụsị nke afọ 1996. “Ọtụtụ ndị nne na nna na Britain esoghị n’ime ụwa nkà na ụzụ dị elu nke ụmụ ha bi n’ime ya. N’ọnwa 18 gara aga ‘inyoba anya n’Ụgbụ Njikọ ahụ’ aghọwo otu n’ime ihe ndị kasị na-ewu ewu ndị dị afọ iri na ụma ji egbu oge,” ka akwụkwọ ahụ kwuru.
Kathleen Mahoney, bụ́ prọfesọ nkà iwu na Mahadum nke Calgary, Canada, na ọkachamara n’okwu ikpe ndị metụtara ihe na-akpali agụụ mmekọahụ kwuru, sị: “Ọha na eze kwesịrị ịmata na e nwere ụzọ nzirịta ozi nke a na-achịkwaghị achịkwa, nke a pụrụ isite na ya metọọ ụmụntakịrị ma rigbuo ha.” Otu onye isi ndị uwe ojii na Canada kwuru, sị: “Ihe àmà ndị ahụ doro anya na ntiwapụ n’okwu metụtara ihe na-akpali agụụ mmekọahụ ụmụaka ndị ha na kọmputa nwere njikọ ga-ewere ọnọdụ n’isi nso.” Ọtụtụ ìgwè ndị na-enye ezinụlọ ndụmọdụ na-ekwusi ike na ihe na-akpali agụụ mmekọahụ na kọmputa nke ụmụntakịrị na-ahụ na mmetụta ọ pụrụ inwe n’ahụ ha “bụ ihe ize ndụ doro anya nke dịkwa adị.”
Echiche Ndị Dịgasị Iche Iche
Mgbalị ọ bụla Òtù Na-eme Iwu na-eme iji gbochie ihe ndị dị ka ihe na-akpali agụụ mmekọahụ na kọmputa, n’ikwekọ ná mkpebi nke Ọkàikpe Holmes na Ụlọikpe Kasị Elu nke United States, na-akpasu ndị nkwado nke nnwere onwe iwe. “Ọ bụ ịma aka ihu na ihu nye Mmegharị Mbụ ahụ,” ka otu prọfesọ nkà mmụta iwu na Harvard kwupụtara. Ọbụna ndị ọkàiwu nweworo ahụmahụ na-akwa ya emo, ka magazin bụ́ Time kwuru. “Ọ gaghị agabiga nnyocha ọbụna n’ụlọikpe na-ahụ maka mpụ ndị dị nta,” ka otu onye kwuru. “Ọ bụ nnyocha gọọmenti na-eme,” ka otu onye isi ọrụ nke Ụlọ Ọrụ Ji Ngwá Electronic Enye Ihe Ọmụma Onwe Onye kwuru. “Mmegharị Mbụ ahụ ekwesịghị ịkwụsị n’ebe Ụgbụ Njikọ ahụ na-amalite,” ka Time hotara ya ka ọ na-ekwu. “O doro anya na ọ bụ mmebi nke nnwere onwe ikwu okwu,” ka otu onye òtù na-eme iwu na United States mara n’ọkwa, “ọ bụkwa mmebi nke ikike ndị toworo eto nwere isoro ibe ha ekwurịta okwu.”
Otu prọfesọ n’Ụlọ Akwụkwọ Nkà Mmụta Iwu dị na New York na-ekwu na e nwere ihe dị mma n’okwu dị iche iche a na-ekwu banyere mmekọahụ, gabiga ihe ruuru mmadụ n’ụzọ ọchịchị na enweghị mgbochi ikwu okwu. “Igosi Mmekọahụ n’Ụgbụ Njikọ ahụ pụrụ n’ezie ịbụ ihe dị mma nye ndị na-eto eto,” ka Time kọrọ n’ihe bụ echiche ya. “[Usoro nzirịta ozi] oghere dị nchebe nke a pụrụ ịchọpụta ihe a machibidoro iwu na ihe a na-asọ nsọ . . . Ọ na-eme ka inwe ezi mkparịta ụka banyere onyinyo bụ ezie tinyekwara echiche efu nke mmekọahụ kwe omume,” ka o kwuru.
Ọzọkwa ọtụtụ ndị ntorobịa dị njikere ibuso mgbochi ọ bụla nke ihe na-akpali agụụ mmekọahụ n’usoro njikọ kọmputa agha, karịsịa ụmụ akwụkwọ mahadum. Ụfọdụ emewo ngagharị iwe megide ihe ha chere na ọ bụ mbelata nke ihe ruuru ha nke nnwere onwe ikwu okwu. Ọ bụ ezie na ọ bụghị nke nwa akwụkwọ, obi abụọ adịghị ya na otu echiche e hotara na The New York Times na-ekwupụta echiche nke ọtụtụ ndị, bụ́ ndị na-ajụ atụmatụ ọ bụla nke ga-amachibido ihe na-akpali agụụ mmekọahụ na kọmputa iwu: “Ọ na-eyi m ka ndị nile na-eji Ụgbụ Njikọ ahụ eme ihe ná mba a ga-ejikọ ọnụ chịa ya ọchị ma leghara ya anya, banyekwara ndị fọdụrụ ná ndị nile na-eji Ụgbụ Njikọ ahụ eme ihe n’ụwa, ọ ga-eme ka United States bụrụ ihe e ji eme ihe ọchị.”
N’ịkọ banyere okwu otu onye ọrụ nke otu ìgwè nnwere onwe, magazin bụ́ U.S.News & World Report kwuru, sị: “Usoro nzirịta ozi [usoro njikọ kọmputa] pụrụ inyekwu nnwere onwe ikwu okwu ikike karịa otú Mmegharị Mbụ ahụ na-enye. N’eziokwu, ọ pụrụ ‘ịbụworị ihe na-ekweghị omume n’ụzọ nkịtị bụ́ gọọmenti imechi ndị mmadụ ọnụ.’”
Na Canada a na-ese okwu banyere ihe pụrụ imebi ndokwa nnwere onwe ikwu okwu n’Akwụkwọ Iwu nke Ihe Ruuru Mmadụ na Nnwere Onwe. E jidewo ndị na-ese ihe, bụ́ ndị ihe osise ha kpasuworo ndị nkatọ na ndị uwe ojii iwe, bụ́ ndị kpọrọ ha “ihe rụrụ arụ.” Ndị na-ese ihe na ndị nkwado nke enweghị mgbochi ikwu okwu ejikọwo aka imegide na ịkatọ njide ahụ dị ka mmebi nke nnwere onwe ikwu okwu ha. Ruo ihe dị ka afọ anọ gara aga, ndị uwe ojii na-ejichi vidio tepụ ihe na-akpali agụụ mmekọahụ site na mgbe ruo na mgbe, ná nkwado nke iwu ihe rụrụ arụ na Canada, e wetakwara okwu ndị ahụ n’ụlọikpe, e kpegbukwara ndị ahịa rere ha.
Otú ọ dị, ihe ndị ahụ nile gbanwere na 1992, mgbe Ụlọikpe Kasị Elu nke Canada kpebiri n’otu okwu ikpe wetara mgbanwe na e chebere ihe ndị dị otú ahụ pụọ n’ịgba akwụkwọ n’ihi nkwa nke nnwere onwe ikwu okwu dị n’Akwụkwọ Iwu nke Ihe Ruuru Mmadụ na Nnwere Onwe. Mkpebi ụlọikpe “ewetawo mgbanwe ndị pụtara ìhè nye ọha mmadụ Canada,” ka magazin bụ́ Maclean’s dere. “N’ọtụtụ obodo ukwu, ọ bụ ihe juru ebe nile ugbu a ịhụ magazin na vidio ihe na-akpali agụụ mmekọahụ ndị jọgburu onwe ha n’ụlọ ahịa ndị dị n’akụkụ ụzọ,” ka magazin ahụ kwuru. A ka nwekwara ọbụna ndị ahụ ụlọikpe kpebiri na a pụrụ ịmachibido iwu, maka ndị na-azụ ha.
“Amaara m na ọ bụrụ na ị banye n’ebe ahụ, ị ga-ahụ ihe ndị a machibidoro iwu,” ka otu onye isi ndị uwe ojii kwuru. “Ikekwe nke ahụ bụ ụdị ihe ndị anyị pụrụ ịgụ iwu megide. Ma . . . anyị enweghị ohere.” Ha enweghịkwa ihe mgbakwasị ụkwụ na ịgba akwụkwọ ndị ahụ ga-enwe ihe ha pụtara. N’ime ọgbọ a nke ime ihe masịrị onye, ebe a na-elekwasịkarị anya ná nnwere onwe onye a na-akparaghị ókè, mkpebi ụlọikpe na-adaberekarịkwa n’echiche ọha mmadụ. Ma n’agbanyeghị ihe kpatara ya, arụmụka ahụ ga-anọgide na-akpali mmetụta uche ndị dị omimi ma na-akpata nkewa n’akụkụ abụọ ahụ—ná nkwado na mmegide.
N’otu oge, Japan chọtara onwe ya n’okpuru mgbochi ndị dị arọ banyere nnwere onwe ikwu okwu na usoro mgbasa akụkọ. Dị ka ihe atụ, a pụghị inye akụkọ ziri ezi banyere otu ala ọma jijiji nke ruru 7.9 n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ Richter ma gbuo ihe karịrị otu puku mmadụ. E nyelighị akụkọ okwu ikpe ndị metụtara ịkpa àgwà na-ezighị ezi na nke ndị hụrụ onwe ha n’anya igbu onwe ha ná nkwekọrịta dị iche iche nke igbu onwe onye. Ndị editọ akwụkwọ akụkọ ji ụjọ kwenye n’iyi egwu gọọmenti ka inwe nchịkwa ji ọsọ rịa elu ọbụna n’ihe banyere ihe ndị e lere anya dị ka ndị na-adịghị mkpa. Otú ọ dị, mgbe Agba Ụwa nke Abụọ gasịrị, e wepụrụ ihe mgbochi dị iche iche, Japan nụkwara ụtọ nnwere onwe ikwu okwu na nke usoro mgbasa akụkọ.
N’eziokwu, mgbanwe ahụ gabigara ókè n’akụkụ nke ọzọ ebe ọ bụ na e ji ihe osise rụrụ arụ ndị na-akpali mmekọahụ mejupụta magazin na ụfọdụ akwụkwọ na-akpa ọchị nke ụmụaka. Akwụkwọ akụkọ a kasị mara amara na Tokyo, bụ́ The Daily Yomiuri, kwuru n’otu mgbe, sị: “Ikekwe otu n’ime ihe ndị kasị na-awụ onye mba ọzọ bịara ọhụrụ na Japan akpata oyi n’ahụ bụ ndị ọchụ nta ego nọ n’ụzọ ndị dị n’okpuru ala na Tokyo na-agụ akwụkwọ na-akpa ọchị ndị na-ekwu okwu mmekọahụ n’ezoghị ọnụ. Ugbu a ọnọdụ ahụ yiri ka ọ na-emetụta ọkara nke ọzọ nke ụba mmadụ, ebe ọ bụ na a na-ahụ akwụkwọ ‘jọgburu onwe ha’ ndị na-akpa ọchị nke ndị inyom n’ebe ndebe akwụkwọ nke obere ụlọ ahịa na nke nnukwu ụlọ ahịa dị iche iche.”
Na 1995 akwụkwọ akụkọ ahụ nwere ùgwù, bụ́ Asahi Shimbun kpọrọ Japan “Paradaịs Mkpali Agụụ Mmekọahụ.” Ka ndị editọ na ndị na-ebipụta akwụkwọ na-achọ ihe ngwọta afọ ofufo nye nkatọ ndị sitere n’aka ndị nne na nna kama nchịkwa ndị ọchịchị, ndị na-eto eto na-agụ ha mere mkpesa. Mmadụ pụrụ ịjụ, sị, ‘Okwu ole ndị ga-emesị nwe mmeri?’
Nnwere onwe ikwu okwu bụ isiokwu oké esemokwu ugbu a na France. “N’enweghị obi abụọ,” ka onye France na-ede akwụkwọ, bụ́ Jean Morange dere n’akwụkwọ ya banyere nnwere onwe ikwu okwu, “akụkọ nke nnwere onwe ikwu okwu akwụsịbeghị, ọ ga-anọgidekwa na-akpata nkewa. . . . O siri ike otu afọ ịgafe n’enweghị mwepụta nke ihe nkiri ma ọ bụ usoro ihe omume telivishọn ma ọ bụ mkpọsa ngwá ahịa nke na-akpata mmeghachi omume n’ụzọ oké iwe, na-akpalite arụmụka ochie ahụ na-adịghị akwụsị akwụsị banyere nnyocha.”
Otu isiokwu pụtara n’akwụkwọ akụkọ Paris, bụ́ Le Figaro, kọrọ na òtù egwú rap a kpọrọ Ministère amer (Ije Ozi Dị Ilu) na-agwa ndị nkwado ya ka ha gbuo ndị uwe ojii. Otu n’ime okwu uri ha na-asị: “Udo agaghị adị ọ gwụla ma [ndị uwe ojii] nwụrụ.” “N’egwú anyị,” ka ọnụ na-ekwuru ìgwè ahụ kwuru, “anyị na-agwa ha ka ha gbaa ụlọ ọrụ ndị uwe ojii ọkụ ma chụọ [ndị uwe ojii] n’àjà. Gịnị pụrụ ikwesị ekwesị karịa nke ahụ?” Ọ dịbeghị ihe e mere òtù egwú rap ahụ.
Òtù egwú rap dị iche iche n’America na-akwalitekwa ogbugbu nke ndị uwe ojii ma na-ekwu na ha nwere ikike ikwu okwu ndị dị otú ahụ n’okpuru nchebe nke nnwere onwe ikwu okwu. Na France, Itali, England na mba ndị ọzọ dị na Europe nakwa gburugburu ụwa, a pụrụ ịnụ ákwá a na-ebe site n’akụkụ nile na e kwesịghị ịkpara nnwere onwe ikwu okwu n’ihu ọha ókè, ọ bụrụgodị na okwu ahụ bụ “ụdị nke pụrụ ịkpata ihe ize ndụ doro anya nke dịkwa adị.” Olee mgbe esemokwu ahụ ga-akwụsị, oleekwa akụkụ nke ga-emeri?
[Foto dị na peeji nke 15]
Ihe na-akpali agụụ mmekọahụ na kọmputa, “ihe yiri akpa nke ihe ‘na-ekwesịghị ekwesị’”