E Gosi Mmasị n’Akwụkwọ Ndị E Ji Amụ Bible na Hungary
Otu onye nkụzi na Balmazújváros degaara alaka ụlọ ọrụ Watch Tower dị na Hungary akwụkwọ, sị: “Ahụwo m otu akwụkwọ nke dọọrọ mmasị m. Ọ bụrụ na o kwere omume, biko ziterenụ m otu. Aha ya bụ Akwukwọm nke Akukọ Bible.” Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ a, onye isi otu ụlọ akwụkwọ na Budapest rịọrọ, sị: “Anyị ga-achọ ịtụ ọda mkpụrụ 20 Akwukwọm nke Akukọ Bible, maka Ụlọ Akwụkwọ Elementrị nke 6.”
Otu onye si Balatonboglár, nke gụworo akwụkwọ bụ́ Questions Young People Ask—Answers That Work dere, sị: “Akwụkwọ ahụ na-akpalite iche echiche, azịza Bible ndị e nyekwara n’ime ya ziri ezi. Akwụkwọ ahụ nyeere m aka nke ukwuu, achọtakwara m azịza nye ajụjụ ndị m nweburu. M ga-achọ iwusiwanye okwukwe m ike ọbụna karị. Ya mere, ọ bụrụ na o kwere omume, biko ziterenụ m akwụkwọ dị iche iche banyere Bible.”
Obi dị Ndịàmà Jehova ụtọ inyere ndị chọrọ ito n’ihe ọmụma Bible aka. Ọ bụrụ na ị ga-achọ inweta otu n’ime akwụkwọ ndị a kpọtụrụ aha n’elu ma ọ bụ ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị n’ebe obibi gị iji soro gị tụlee Bible, biko deta akwụkwọ na Watch Tower, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State, Nigeria, ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 5.