Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 8/8 p. 31
  • Ihe Ọ Chọrọ Bụ Ime Ihe n’Eziokwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ọ Chọrọ Bụ Ime Ihe n’Eziokwu
  • Teta!—1996
Teta!—1996
g96 8/8 p. 31

Ihe Ọ Chọrọ Bụ Ime Ihe n’Eziokwu

Otu nwa agbọghọ n’Ecuador gara ịza ajụjụ ọnụ e ji ewe mmadụ n’ọrụ. Mgbe o sooro ndị ọzọ bịara maka ajụjụ ọnụ ahụ kparịtasịa ụka—ha dị 36 ná ngụkọta—ọ ghọtara na ohere ndị o nwere dị nnọọ nta. Ha nwere ahụmahụ ọrụ na mmụta mahadum, ma ọ dịghị nke o nwere. N’ime ajụjụ isii ndị a jụrụ, ọ zataghị abụọ. Otú ọ dị, otu ajụjụ bụ ụdị mmadụ na-aza n’onwe ya: “Gịnị bụ eziokwu nye gị?”

Nwanyị ahụ zara, sị: “Eziokwu abụghị echiche efu na-adịghị adị kama ọ bụ ihe anyị kwesịrị iji na-adị ndụ. Anyị kwesịrị ikwu eziokwu ọ bụghị ịgha ụgha, n’ihi na ọ bụrụ na anyị aghaa ụgha, anyị na-esonyere Setan bụ́ Ekwensu. Ọ bụrụ na anyị ekwuo eziokwu, anyị na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ ma na-erite ọtụtụ uru onwe onye.”

Mgbe manịja ahụ jụrụ ihe bụ okpukpe nwanyị ahụ, ọ zaghachiri na ya bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. N’ụbọchị na-esonụ a gwara ya na a họrọwo ya maka ọrụ ahụ. Mgbe otu ọnwa gasịrị nwanyị ahụ jụrụ manịja ahụ ihe mere o ji họrọ ya, o kwukwara na ọ bụ n’ihi ime ihe n’eziokwu ya.

Ọ́ bụghị eziokwu na ọtụtụ ndị taa adịghị eme ihe n’eziokwu? N’aka nke ọzọ, a maara ndị na-akwanyere Bible ùgwù maka ime ihe n’eziokwu ha. Ụlọ Nche nke July 1, 1995, sịrị: “N’ime Bible, ‘eziokwu’ adịtụghị ka echiche efu, nke na-adịghị adị nke ndị ọkà ihe ọmụma ụwa na-arụ ụka banyere ya.”

Ị ga-erite uru site n’ịgụchi Ụlọ Nche anya, bụ́ nke a maara n’ụwa nile dị ka onye nkwado nke eziokwu Bible.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya