Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 8/8 p. 29-30
  • Ikiri Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikiri Ụwa
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Inyom “Na-efu Efu”
  • Ngwá Agha Ka Ọ̀ Bụ Mmepe?
  • Ihe Ize Ndụ nke Anụ Moose Na-agafe n’Okporo Ụzọ
  • Nsogbu Nauru
  • Ike Na-agwụ Ọrịa Arịkwa Mmiri
  • Klọkụ Ụbọchị Mbibi Agaa n’Ihu
  • A Gbahapụ Ụmụ Ọhụrụ
  • Akpịrị Ịkpọ Nkụ Ezughị
  • Ili A Ma Ama n’Ijipt Emepee
  • Agha Nuklia—Olee Ndị Na-eyi Egwu Ya?
    Teta!—2004
  • Ọ̀ Bụ Njedebe nke Iyi Egwu Nuklia?
    Teta!—1999
  • Mmebi Ụwa Ò Ruwela Ka Ọ̀ Bụ Na O Ruwebeghị?
    Teta!—2017
  • Iyi Egwu Nuklia Akwụsịbeghị Ma Ọlị
    Teta!—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 8/8 p. 29-30

Ikiri Ụwa

Ndị Inyom “Na-efu Efu”

“N’ọha mmadụ ebe a na-emeso ndị inyom n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’ihe banyere ahụ ike, e nwere 106 ndị inyom maka 100 ndị ikom ọ bụla. Nke a bụ eziokwu sitere n’ọmụmụ,” ka magazin bụ́ The Courier na-ekwu, bụ́ nke Òtù Ndị Europe bipụtara. Ma ihe ọmụmụ òtù UN na-ezokwa aka n’eziokwu ọzọ: Ná mba Esia ndị dị ka China, India, Republic of Korea, na Pakistan, e nwere ná nkezi, nanị 94 ndị inyom maka 100 ndị ikom ọ bụla. N’ihi gịnị? “Ọganihu sayensị emeela ka o kwe omume ịmata ná mmalite ma nwa e bu n’afọ ọ̀ bụ nwoke ka ọ bụ nwanyị,” o mesiwanyewo “ekwekọghị ekwekọ ndị dị ná nkezi ọmụmụ nwoke ma ọ bụ nwanyị” ike, ka The Courier na-akọwa. Dị ka ihe atụ, na Republic of Korea, a mụrụ 94 ụmụ agbọghọ maka 100 ụmụ okoro ọ bụla na 1982, ma nkezi ahụ dalatara ruo na 88 maka 100 ọ bụla na 1989. Akwụkwọ òtù UN bụ́ Our Planet na-agbakwụnye, sị: “Ndekọ ọnụ ọgụgụ ahụ na-awụ akpata oyi: 100 nde ndị inyom Esia ‘na-efu efu’ n’ihi igbu ụmụ ọhụrụ na nsikwopụ afọ ime nke ụmụ ọhụrụ bụ́ ndị inyom.”

Ngwá Agha Ka Ọ̀ Bụ Mmepe?

A pụrụ iji 100 dollar United States zụta otu ọkpọka égbè AK-47 ma ọ bụ mkpụrụ ọgwụ vitamin A ga-ezu iji gbochie 3,000 ụmụaka gbara otu afọ ikpu ìsì. A pụrụ iji otu narị nde dollar zụta nde ogbunigwe iri ma ọ bụ ọgwụ mgbochi ọrịa zuru ezu iji chebe 7.7 nde ụmụaka pụọ n’ajọ ọrịa isii na-arịakarị ụmụaka. A pụrụ iji 800 nde dollar zụta 23 ụgbọ elu agha bụ́ F-16 ma ọ bụ zụta ọgwụ nnu iodine ruo afọ iri, na-echebe 1.6 ijeri mmadụ pụọ n’ọrịa ụkọ iodine na-akpata, dị ka mbelata nke ike iche echiche. A pụrụ iji ihe dị ka 2.4 ijeri dollar zụta otu ụgbọ okpuru mmiri nke nuklia ma ọ bụ mmiri na ihe ndị e ji edebe ihe ọcha maka 48 nde mmadụ. Olee ebe ụwa na-edebe ihe ndị kasị mkpa? Dị ka akwụkwọ bụ́ The State of the World’s Children 1996 si kwuo, iresị mba ndị ka na-emepe emepe ngwá agha na 1994 nanị nwere ngụkọta nke $25.4 ijeri, ego a pụwororịị iji mee ihe ná mgbalị mmepe.

Ihe Ize Ndụ nke Anụ Moose Na-agafe n’Okporo Ụzọ

Gịnị mere anụ moose ji agafe n’okporo ụzọ? Ajụjụ a abụghị egwuregwu nye ndị ọkà mmụta ná ndụ anụ ndị bi n’ọhịa na Newfoundland ma ọ bụ nye ndị ọkwọ ụgbọ ala n’ebe ahụ na ọtụtụ puku ndị na-eme njem nleta, bụ́ ndị ji okporo ụzọ awara awara nke ógbè ahụ eme ihe. “A na-enwe ihe dị ka 300 ihe mberede ụgbọ ala na anụ moose n’otu afọ n’okporo ụzọ awara awara ndị dị na Newfoundland, ndị ọtụtụ n’ime ha na-akpata ọnwụ nke ndị ọkwọ ụgbọ ala,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Globe and Mail na-ekwu. “Ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị arọ anụ moose nke ruru 450 kilogram [1,000 pound] pụrụ ịdakwasị n’elu ụgbọ ala dị ka nnukwu okwute, na-egbu ma ọ bụ na-emerụ mmadụ ahụ.” Nanị ibelata ụba nke anụ moose bụ́ 150,000 n’àgwàetiti ahụ nwere ike ghara ịdị irè, ka Shane Mahoney nke Ngalaba Ihe Ndị Sitere n’Okike na-ekwu, n’ihi na n’ọtụtụ ebe e nwere ụba dị ala nke anụ moose, a na-enwe ọnụ ọgụgụ dị elu nke ihe mberede. Site n’inyocha ngagharị nke ìgwè anụ, ndị ọkà mmụta sayensị nwere olileanya ịmata ihe mere anụ moose, ndị na-atụkarị ụjọ ụgbọ ala, ji ekpebi ịdị na-agafe n’okporo ụzọ.

Nsogbu Nauru

Ọ dị mgbe a matara Nauru, ọchịchị repọblik kasị nta, nke kasịkwa dịpụ adịpụ n’ụwa nile, maka ịma mma ya nke ebe okpomọkụ. Ndị njem ụgbọ mmiri Europe bụ́ ndị mbụ ji anya gwuru àgwàetiti ahụ dị 20 square kilomita na narị afọ nke 18 kpọrọ ya Àgwàetiti Ọma. Otú ọ dị, nanị otu ahịrị ụsọ mmiri dị warara ka a pụrụ ibi na ya ugbu a, Nauru aghọwokwa “mba kasị bibie ebibi n’ihe metụtara gburugburu ebe obibi n’ụwa,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times na-ekwu. N’ihi gịnị? Igwupụta akụ̀ n’ala. Ruo 90 afọ a nọwo na-egwupụta phosphate, bụ́ ihe sitere n’ihe ndị dapụnahụworo nnụnụ eri ọtụtụ puku afọ, tinyere ihe ndị dị n’ime mmiri bụ́ ndị a na-adịghị eji anya nkịtị ahụ, “na-ahapụzi ogidi nkume limestone na-atụ egwu ma na-achanwụ achanwụ nke jupụtara na pit, ụfọdụ n’ime ha dị elu ruo 22 mita.” Okpomọkụ si n’ụzọ anọ n’ime ụzọ ise nke àgwàetiti ahụ ebe e gwupụtaworo akụ̀ na ya emetụtawokwa ihu igwe, na-achụsasị igwe ojii mmiri ozuzo ma na-eji oké ọkọchị na-eti ala ahụ ihe otiti. A na-atụ anya na a ga-egwupụta ọdọ ikpeazụ nke phosphate n’ime afọ ise. Ọtụtụ ndị Nauru na-eche na nanị nhọrọ bụ ịgbahapụ Nauru ma jiri akụ̀ na ụba ha zụrụ ebe obibi àgwàetiti ọhụrụ ebe ha ga-akwaga.

Ike Na-agwụ Ọrịa Arịkwa Mmiri

“E wezụga kịtịkpa, o yikarịrị ka arịkwa mmiri bụ ọrịa nke abụọ na-arịa ụmụ mmadụ nke a gaje ikpochapụ,” ka magazin bụ́ The Economist na-ekwu. “Ọnụ ọgụgụ ndị a kọrọ na ọrịa a ji, bụ́ nke fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 900,000 n’ụwa nile n’oge na-adịbeghị anya dị ka 1989, dalatara ruo 163,000 n’afọ gara aga, kwa afọ ọ na-abụkwa ọkara nke ahụ n’ime ihe ka ọtụtụ ná mba.” Ebe a gụpụrụ bụ Sudan, “na-egosi na agha na ọrịa na-aga ụkwụ na ụkwụ.” Nje na-esite na mmiri nke nwere mmalite ya n’àkwá a na-adịghị ahụ n’anya efu, e kpochapụworị arịkwa mmiri n’Ebe Etiti Esia, Pakistan, na ọtụtụ mba Africa. Ụlọ ọrụ dị iche iche achịkwawo ya site n’iji ọgwụ ndị e ji eme ka mmiri dị ọcha eme ihe, ịkụziri ndị mmadụ iji ákwà na-azacha mmiri ọṅụṅụ ha, na igbochi ndị bu ọrịa ahụ ịsa ahụ ma ọ bụ irufe n’isi iyi nke mmiri ọṅụṅụ. Ozugbo ọ banyere, arịkwa ndị bụ́ óké na-anwụ mgbe ha gbasịrị nne, ndị nne ha pụrụ iru ihe dị ka otu mita n’ogologo tupu ha esite n’etuto na-egbu mgbu n’ụkwụ onye na-arịa ya pụta mgbe ọtụtụ izu gasịrị, mgbe ụfọdụ na-akwarụ ma ọ bụ na-ebibi uru ahụ.

Klọkụ Ụbọchị Mbibi Agaa n’Ihu

N’oge na-adịbeghị anya a hịọgharịwo aka klọkụ ụbọchị mbibi ahụ a ma ama nke dị n’azụ akwụkwọ bụ́ The Bulletin of the Atomic Scientists ka o jiri nkeji atọ dịkwuo etiti abalị nso. N’ụzọ ihe atụ klọkụ ahụ na-egosi otú ụwa si nọrọ nso n’agha nuklia. Kemgbe e mepụtara ya na 1947, a hịọgharịwo aka klọkụ ahụ ugboro 16 n’ikwekọ n’ihe omume ụwa na-agbanwe agbanwe. Oge kasị nso ọ bịarutụworo n’etiti abalị nuklia—nkeji abụọ—bụ na 1953 mgbe United State gbawasịrị bọmbụ hydrogen mbụ. Mgbanwe ikpeazụ bụ na 1991 mgbe, a hịọghachiri ya azụ gaa ná nkeji 17 tupu etiti abalị n’ihi nchekwube sochiri Agha Nzuzo. Ịhịọgharị klọkụ ahụ gaa ná nkeji 14 na-egosipụta nchegbu na-amụba amụba banyere nrụgide ụwa na-arị elu, anọghị ná ntụkwasị obi nke nkwakọba ngwá agha nuklia, na ihe ize ndụ nke iji nuklia eyi ọha egwu. “Ụwa ka bụ ebe dị oké ize ndụ,” ka Leonard Rieser, bụ́ onye isi oche nke The Bulletin, kwuru.

A Gbahapụ Ụmụ Ọhụrụ

N’Itali, nne pụrụ iji ụzọ iwu kwadoro jụ ịnakwere nwa ọhụrụ ya, na-ahapụrụ ndị na-ahụ maka ụmụaka ibu ọrụ nke ịchọta di na nwunye dị njikere ikuchi ya. Ma, n’ime 1995 a gbahapụrụ ihe ruru 600 ụmụaka n’ọmụmụ, “ọtụtụ n’ime ihe a na-awụnye ihe mkpofu, ndị ọzọ n’ebe ndị dị chọọchị ma ọ bụ ụlọ ọrụ nlekọta ahụ ike nso,” ka akwụkwọ akụkọ ndị Itali bụ́ La Repubblica na-ekwu. Ihe ijuanya ahụ na-eme n’akụkụ obodo ahụ ndị kasị mepee emepe na ebe kasị baa ọgaranya, nakwa n’ebe kasị daa ogbenye na ebe kasị ala ná mmepe. Dị ka Vera Slepoj, onye isi oche nke Òtù Akparamàgwà Mmadụ n’Itali si kwuo, nke a bụ “ihe mgbaàmà ịdọ aka ná ntị banyere echiche nke ọnwụ” nke jupụtara ọha mmadụ.

Akpịrị Ịkpọ Nkụ Ezughị

“Ọ bụrụ na mmadụ adabere nanị n’akpịrị ịkpọ nkụ, ọ gaghị aṅụ mmiri zuru ezu,” ka Dr. Mark Davis, prọfesọ nkà mmụta mmega ahụ na-ekwu. Ọtụtụ ndị nọ nke nta n’ọnọdụ ụkọ mmiri ahụ, ebe ọ bụ na mmetụta nke akpịrị ịkpọ nkụ na-ewere ọnọdụ mgbe mmiri ahụ dị ala. Ka ndị mmadụ na-emewanye okenye, ịdị nkọ nke usoro akpịrị ịkpọ nkụ ha na-adị ala. Dị ka a kọrọ n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times, anyị na-enwe mkpa nke mmiri ka ukwuu mgbe ihu igwe dị nnọọ ọkụ ma ọ bụ jụọ oyi gabiga ókè ma kpọọ nkụ, mgbe anyị na-emega ahụ ma ọ bụ na-ebelata ọ̀tụ̀tụ̀ nri anyị, na mgbe anyị nwere ọrịa ọ bụla nke ya na ọnọdụ ndị dị ka otoro, ahụ ọkụ na ịgbọ agbọ so agakọ, bụ́ ndị na-akpata ụkọ mmiri. Ndị na-eri ihe oriri ndị nwere fiber dị ukwuu na ha na-achọkwa mmiri iji mee ka fiber ahụ nọgide na-agagharị n’ime afọ. Ọ bụ ezie na mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri pụrụ inwe pasent dị elu nke mmiri, a na-egbo ihe ka ukwuu ná mkpa anyị site n’ịṅụ mmiri. Mmiri kasị mma, ebe ọ bụ na ahụ na-amịrị ya ngwa ngwa. Ruo n’ókè ihe ọṅụṅụ dị ụtọ, otú ahụ ka ahụ na-ejikwu nwayọọ nwayọọ na-amịrị ya. Soda pụrụ n’ezie ime ka akpịrị kpọọ gị nkụ karị, ebe ọ bụ na mmiri dị mkpa iji gbarie shuga ahụ. Ebe ọ bụ na caffeine na mmanya na-aba n’anya bụ ihe ndị na-amụba ọ̀tụ̀tụ̀ ịnyụ mamịrị, ịdabere n’ihe ọṅụṅụ nwere ha pụrụ ịkpata ụkọ mmiri. “Ndị toworo ogo mmadụ kwesịrị ịṅụ ma ọ dịkarịa ala mmiri ruru iko nkụwa asatọ dịcha ounce asatọ kwa ụbọchị,” ka Times ahụ na-ekwu.

Ili A Ma Ama n’Ijipt Emepee

E debeghachiwo ili Nefertari ahụ dị na Ndagwurugwu nke Ndị Eze Nwanyị Luxor, bụ́ nke e mechiri eri ọtụtụ afọ, n’ọnọdụ ya, ma mepeghachiri ya ọha mmadụ. “‘Ili a bụ n’ezie nke kasị akpali akpali n’ụsọ mmiri ọdịda anyanwụ nke Luxor, ma ọ bụ ọbụna n’Ijipt nile,’ ka Mohammed el-Soghayer, onye isi nke ngalaba Kansụl Kasị Elu Maka Ihe Mgbe Ochie dị na Luxor kwuru. ‘O doro anya na ọ bụ ndị ọkà kasị nwee nkà rụrụ ya n’oge Ramses nke Abụọ, onye wuru ihe ncheta ndị eze nke a n’ihi oké ịhụnanya ya maka Nefertari. Ọ chọrọ ka o nwee ili kasị mma a pụrụ inwe.’” Otú ọ dị, ọ fọrọ nke nta ka iju mmiri, apịtị, na nnu crystal na-abami abami bibie ogige ahụ dị 430 square mita nke nwere ọtụtụ ihe osise mara mma. Na 1986, mgbe ọtụtụ afọ nke nkwurịta okwu gasịrị, otu ìgwè sitere ọtụtụ mba malitere ọrụ siri oké ike nke ijikọta iberibe ihe osise, na-eji foto ndị Ernesto Schiaparelli sere eme ihe, bụ́ onye Itali bụ ọkachamara n’ihe ọmụmụ ihe mgbe ochie Ijipt, bụ́ onye chọpụtara ili ahụ. Otú ọ dị, e gbochiwo ọnụ ọgụgụ ndị nleta n’ihi nchegbu banyere ọ̀tụ̀tụ̀ ịjụ oyi. Ramses nke Abụọ nyekwara Nefertari nsọpụrụ mgbe ọ kpọkwasịrị ya otu n’ime ụlọ nsọ ndị dị n’Abu Simbel.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya