Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Gịnị Mere Ndị Ntorobịa Ndị Ọzọ Ji Ekpori Ndụ Otú A?
“Anyị chọrọ nanị ikpori ndụ, ma o siri oké ike,” ka Jason dị afọ 15 mere mkpesa ya.
Ọ BỤ nnọọ ihe e bu pụta ụwa ịchọ ikpori ndụ—karịsịa mgbe ị na-eto eto! Nye ọtụtụ ndị ntorobịa, ikpori ndụ dị mkpa dị ka iri ihe na ihi ụra. N’ịbụ ndị ndị ọgbọ ha na usoro mgbasa ozi na-akpali, ndị ntorobịa ji ịnụ ọkụ n’obi na-achụso ihe omume ntụrụndụ dịgasị iche iche. Dị ka otu nnyocha si egosi, ileta ndị enyi, ikiri TV, ịga ihe nkiri, nnọkọ oriri, na ite egwú butere ụzọ ná ndepụta nke ihe omume ntụrụndụ uhuruchi ndị e nwere mmasị na ha n’etiti ndị nọ n’afọ iri na ụma. Ịgụ akwụkwọ, ime egwuregwu, na ige egwú sokwa ná ndị na-ewu ewu.
Ebe e nwere ọtụtụ ihe omume mkpori ndụ otú a, ọ pụrụ isiri ndị meworo okenye ike ịghọta ihe mere ndị ntorobịa ụfọdụ, dị ka Jason, ji eche na ha adịghị ekpori ndụ n’ụzọ zuru ezu. Ma nke ahụ bụ kpọmkwem ihe ụfọdụ ndị ntorobịa ndị Kraịst kwuworo! Casey na-eto eto, otu n’ime Ndịàmà Jehova, si otú a tinye ya: “Ị na-ahụ ka ndị enyi gị nile n’ụlọ akwụkwọ na-enwe nnọkọ oriri ma na-eme ọtụtụ ihe, ọ na-adịkwa gị nnọọ ka a kpapụrụ gị iche.” Ma ọnọdụ ahụ ọ̀ dịru njọ otú ahụ?
Bible ọ̀ na-amachibido ikpori ndụ? Ọ dịghị ma ọlị. Bible na-akpọ Jehova “Chineke nke obi ụtọ.” (1 Timoti 1:11, NW) N’ihi ya o kwesịghị iju gị anya na Eze Solomọn sịrị: “Ihe ọ bụla nwere oge, . . . mgbe ịkwa ákwá, na mgbe ịchị ọchị; mgbe iru újú, na mgbe ite egwú.” (Eklisiastis 3:1, 4) Okwu Hibru mbụ maka “ọchị” n’ebe a na okwu ndị yiri ya pụkwara ịpụta ‘igwu egwú’ na ‘ime ihe ọchị.’—2 Samuel 6:21; Job 41:5; Ọpụpụ 32:6; Jenesis 26:8; Ndị Ikpe 16:25.
Laa azụ n’oge Bible, ndị Chineke nụrụ ụtọ ọtụtụ ihe omume ndị dị mma, dị ka iti egwú, ịgụ egwú, ite egwú, ịkparịta ụka, na igwu egwú. Ha nwekwara oge ndị pụrụ iche maka ime oriri na mkpakọrịta na-enye ọṅụ. (Jeremaịa 7:34; 16:9; 25:30; Luk 15:25) Leenụ, Jisọs Kraịst n’onwe ya gara ememe agbamakwụkwọ!—Jọn 2:1-10.
Ya mere a machibidoghị mkpori ndụ dị mma iwu n’etiti ndị ntorobịa ndị Kraịst taa. N’ezie, Bible na-asị: “Ṅụrịa, nwa okorobịa, na nwata ị bụ; ka obi gị meekwa gị mma n’ụbọchị nile nke okorobịa ị bụ.” Otú ọ dị, Solomọn ji ịdọ aka ná ntị sochie okwu ndị a: “Ma mara na n’ihi ihe ndị a nile Chineke ga-eme ka ị baa n’ikpe.” (Eklisiastis 11:9) Ee, ị ga-aza ajụjụ n’ihu Chineke maka nhọrọ ndị ị na-eme. N’ihi ya ị ghaghị ‘ilezi anya otú ị na-ejegharị, ọ bụghị dị ka onye na-amaghị ihe, kama dị ka onye maara ihe’ mgbe a bịara n’ihe metụtara ntụrụndụ. (Ndị Efesọs 5:15, 16) N’ihi gịnị? Ọtụtụ ndị na-eto eto na-eme nhọrọ na-adịghị mma n’ihe banyere nke a.
Mgbe Mkpori Ndụ Na-ekweghị Nchịkwa
Tụlee ihe mere laa azụ n’oge Bible. Ụfọdụ ndị Israel enwekwaghị echiche ọ bụla nke nguzozi mgbe a bịara ná ntụrụndụ, na-enwe nnọkọ oriri ndị dịruru ogologo abalị nile! Aịsaịa onye amụma sịrị: “Ahụhụ ga-adịrị ndị na-ebili n’isi ụtụtụ ịgbaso ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya; ndị na-anọ ogologo mgbe n’anyasị, mmanya vine ewee mee ka ahụ nwuru ha ọkụ. Ụbọ akwara na une na egwú otiti na ọjà na mmanya vine dịkwa n’ọṅụṅụ mmanya vine ha nile.” Ọ bụghị na ọ dị njọ izukọta ma na-anụ ụtọ ihe oriri, egwú, na ite egwú. Ma Aịsaịa na-ekwu banyere ndị a na-eme ememe oké mkpọtụ, sị: “Ha adịghị elegide ọrụ Jehova anya.”—Aịsaịa 5:11, 12.
Ọtụtụ ndị ntorobịa taa na-eme otu ihe ahụ—ha adịghị echebara Chineke echiche mgbe ha na-achụso ntụrụndụ. Ụfọdụ na-eji nlelị na-eleghara ụkpụrụ Chineke anya, na-etinye aka ná mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye, imebisi ihe, iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, na akparamàgwà ndị ọzọ nke ejighị ihe kpọrọ ihe n’ụdị “ikpori ndụ.” Otú ọ dị, n’ọnọdụ ndị ọzọ, ndị na-eto eto adịghị eme mgbalị n’ezie ime ihe ọjọọ. Ma ha adịghị emeru ihe n’ókè, ha adịghịkwa ezere imebiga ihe ókè. (Ilu 23:20; 1 Timoti 3:11) Ya mere mgbe ha bịakọrọ ọnụ ime onwe ha obi ụtọ, ọ na-eyi ka ihe adịghị ekwe nchịkwa.—Tụlee 1 Ndị Kọrint 10:6-8.
N’oge na-adịbeghị anya, Teta! jụrụ ụfọdụ ndị na-eto eto sị, “Gịnị na-ewere ọnọdụ taa ná nnọkọ oriri nke ndị ụwa?” Otu nwa agbọghọ nọ n’afọ iri na ụma zara, sị: “Ọgwụ ọjọọ, ịṅụ mmanya. Ọ na-eme n’ezie.” Andrew na-eto eto kwuru banyere ụfọdụ n’ime ụmụ okoro ụlọ akwụkwọ ya na-agakarị nnọkọ oriri, sị: “Nanị ihe ha na-eme bụ itu ọnụ banyere ókè ha ṅụruru ná mmanya.” Ọbụna na Jason gara n’ihu wee kwuo, sị: “Ọ na-afọ nke nta ka ọ bụrụ na ihe ọjọọ na-ewere ọnọdụ mgbe nile ná nnọkọ oriri ndị ụwa.” Ebe ọ bụ na a katọrọ “oriri oké mkpọtụ” (NW), ma ọ bụ “nnọkọ oriri na-enweghị nchịkwa,” n’ime Bible, ndị ntorobịa na-atụ egwu Chineke na-ezere nnọkọ oriri na ọṅụṅụ ndị nwere ụdị ihe ndị ahụ na ha.—Ndị Galetia 5:21; Byington.
Ihe ize ndụ pụrụ ọbụna ịdị n’ụdị ntụrụndụ ndị dị ka ha adịghị emerụ ahụ. Dị ka ihe atụ, ihe ka ọtụtụ n’ihe nkiri ndị a ma ama taa na-egosi ịgba ọtọ, mmekọahụ jọgburu onwe ya, na ajọ ime ihe ike. Egwú ndị na-ewu ewu na-enwekarị okwu ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. Ebe a na-eti egwú rock na-abụkarị ebe e ji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ebe ịgba aghara, na ebe a na-eme ihe ike.a
Mgbe Nne na Nna Sịrị Ee e
Gịnị bụ isi ihe dị mkpa? Ọ bụrụ na ị bụ onye Kraịst, ị pụghị nnọọ ime ihe nile na-amasị ndị ọgbọ gị ime. E kwuwerị, Jisọs sịrị na ndị na-eso ụzọ ya agaghị abụ “akụkụ nke ụwa,” nke ahụ pụtakwara ịdị iche n’ebe ndị ọzọ nọ. (Jọn 15:19, NW) Ọ bụrụ na nne na nna gị na-atụ egwu Chineke, eziokwu a doro ha anya nke ọma. Ya mere, mgbe ụfọdụ n’ihi ọchịchọ ichebe gị, ndị mụrụ gị pụrụ ịkụda gị aka ma ọ bụ ịmachibidosi ihe ụfọdụ iwu ike—ihe ndị a na-ahapụ ndị ntorobịa ndị ọzọ ime. Nke a adịghị mfe ịnakwere mgbe nile. “Ndị mmadụ chọrọ ikpori ndụ!” ka otu nwa agbọghọ nọ n’afọ iri na ụma kwusiri ike. “Ndị mụrụ anyị kporiri ndụ mgbe ha bụ ụmụaka, ma mgbe ụfọdụ ọ na-adị ka ha chọrọ ịkpọchibido anyị.”
Ọ pụrụ ịbụ na ịgbaso ndụmọdụ ndị mụrụ gị n’okwu ndị dị otú ahụ agaghị adị mfe, ọbụna mgbe ị na-ele ihe anya n’ụzọ bụ isi n’otu ụzọ ahụ ha si ele ya. Otu ntorobịa dị gara gara nke anyị ga-akpọ Jared na-echeta: “Achọrọ m isoro òtù ụlọ akwụkwọ tụọ basketball. Ọtụtụ ndị na-arụgide m ịtụ ya, o nyetụkwara m nsogbu. Ma mgbe ahụ agwara m ndị mụrụ m okwu.” Nne na nna Jared gosipụtara ihe ize ndụ nke “mkparịta nile ọjọọ” ma chetara ya banyere otú egwuregwu ya ga-esi na-erikpọ oge. (1 Ndị Kọrint 15:33) “Otú ahụ ka o si mee,” ka Jared ji mwute na-ekwu. Ọ gbasoro ndụmọdụ ndị mụrụ ya, ma ọ ka wutekwara ya na o sonyeghị n’ịtụ bọl ahụ.
‘Ihe Na-efunahụ M!’
N’agbanyeghị ihe ọnọdụ gị bụ, ị pụkwara inwe nkụda aka site n’oge ruo n’oge mgbe ị nụrụ ka ụmụ akwụkwọ ibe gị na-etu ọnụ banyere obi ụtọ ha na-enwe. ‘Gịnị mere ndị ntorobịa ndị ọzọ ji ekpori ndụ otú a?’ ka ị pụrụ ịjụ. Ee, olee otú ị pụrụ isi merie mmetụta nke bụ na ihe na-efunahụ gị?
Ọ pụrụ inye aka ma ọ bụrụ na ị gụọ Abụ Ọma 73 ma tụgharịa uche n’ahụmahụ nke onye ahụ so dee Bible aha ya bụ Esaf. N’amaokwu nke 2 na nke 3, ọ na-ekwupụta nke a: “Nye mụ onwe m, ọ fọrọ nke nta ka ụkwụ m abụọ wezụga onwe ha, ọ fọrọ nke nta ka e mee ka nzọụkwụ m gbụchapụ. N’ihi na ekwosoro m ndị na-etu ọnụ ekworo.” Ee, ka Esaf na-adị ndụ nwere ihe mgbochi, ndị ọzọ turu ọnụ na ha pụrụ ime ihe ọ bụla ha chọrọ—nke ihe ọjọọ nwere ike ghara isi na ha pụta. O yiri ka ha nwere ọtụtụ ihe, ma ka na-enwetakwa ndị ọzọ. (Amaokwu nke 12) N’ihi ya Esaf nwere oké nkụda aka nke na o tiri mkpu, sị: “Mgbe ahụ, ọ̀ bụ n’efu ka m nọgideworo na-edebe onwe m ọcha, n’emeghịkwa mmehie?”—Abụ Ọma 73:13, Today’s English Version.
Ọ dabara nke ọma na Esaf ghọtaghachiri onwe ya tupu o mehie ihe. Ọ gara nleta “n’ebe nsọ nile nke Chineke,” na gburugburu ebe ahụ dịkwa ọcha, o chebaara okwu ndị ahụ ezi echiche. N’oge na-adịghị anya, Esaf emeworị nkwubi okwu pụtara ìhè banyere ndị na-achụso ihe ụtọ, bụ́ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke: “N’ezie ọ bụ n’ebe nile na-alọ alọ ka ị na-edo ha: I mewo ka ha daruo ntikpọ.”—Abụ Ọma 73:17, 18.
A pụkwara ikwu otu ihe ahụ banyere ọtụtụ n’ime ndị ọgbọ gị na-achụso ihe ụtọ. Ha pụrụ iche na ha na-enwe obi ụtọ ugbu a. Ma inwe ihe ụtọ nke mmehie na-adịru nanị nwa oge! (Ndị Hibru 11:25) N’ihi na ha adịghị agbaso ụkpụrụ Bible, ha na-eguzo “n’ebe nile na-alọ alọ,” ha nọkwa mgbe nile n’ihe ize ndụ nke ntipịa jọgburu onwe ya—na mberede, n’enyeghịkwa ịdọ aka ná ntị. Okwu Chineke na-ekwu, sị: “Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi.” (Ndị Galetia 6:7) O doro anya na ị nụwo banyere ndị ọgbọ gị bụ́ ndị na-eto eto nwụworo ọnwụ nnwụchu, bute ọrịa mmekọahụ, afọ ime a na-achọghị, ma ọ bụ jee ngá n’ihi àgwà ọjọọ nke “ikpori ndụ.” Mgbe ahụ, ọ́ dịghị abara gị uru izere ihe ndị dị otú ahụ?—Aịsaịa 48:17.
Solomọn na-enye ezi ndụmọdụ mgbe ọ na-asị: “Ekwela ka obi gị kwosoo ndị mmehie ekworo: kama n’egwu Jehova ka ị ga-anọ ogologo ụbọchị nile. N’ihi na ọdịnihu aghaghị ịdị; a gaghị ebipụkwa olileanya gị.” (Ilu 23:17, 18) Ee, e nweghị oge “obi ụtọ” ruru eru iji tụfuo olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs n’elu ala.
Ka ọ dị ugbu a, olee otú ị pụrụ isi mejuo ọchịchọ ebumpụta ụwa gị inwe ezi obi ụtọ site n’oge ruo n’oge? È nwere ụzọ ndị dị mma, na-adịghị ize ndụ isi mee otú ahụ? Gịnị ma ọ bụrụ na ego na ihe ndị ọzọ dị obere? Teta! jụrụ maka aro na echiche ụfọdụ site n’ọnụ ndị ntorobịa gburugburu ụwa. A ga-atụle nke a n’isiokwu dị n’ihu n’usoro nke a.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee isiokwu “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . M̀ Kwesịrị Ịga Ebe A Na-eti Egwú Rock?” nke dị ná mbipụta anyị nke December 22, 1995 (Bekee).
[Foto dị na peeji nke 27]
Ì kwesịrị iche na ihe na-efunahụ gị n’ihi na ị pụghị ikere òkè n’ihe ụwa na-akpọ mkpori ndụ?