“Agbamume na Olileanya Dị M Mkpa”
Ọ̀ dị mgbe ọ bụla ị na-eche otú ahụ? Ọtụtụ ndị taa na-eche otú ahụ. Otu nwanyị sitere Fort Smith, Arkansas, degaara isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York, akwụkwọ wee kọwaa, sị:
“Akwụkwọ unu bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi na-enye nnọọ ihe ọmụma, na-akpalikwa akpali. Agụrụ m ya site ná mmalite ruo ná ngwụsị nanị n’ụbọchị ole na ole. Ọ na-enye m olileanya na n’isi nso ụwa ọhụrụ ahụ e kwere ná nkwa n’okpuru ịchịisi Jisọs Kraịst, ga-abịa. Ana m atụ anya ụbọchị ahụ.
“Tupu mgbe ahụ, ihe chere m ihu bụ ịlanarị ụwa nke a, na-echere ka nke ahụ were ọnọdụ. Ndụ ihe efu a, nke na-agwụ ike, na-adịghị akpali mmasị na-akụda m mmụọ. Agbamume na olileanya dị m mkpa. Unu kwuru na site ná nzukọ unu anyị pụrụ inwe ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu ma ọ bụrụ na anyị nwere mmasị. Biko ùnu pụrụ ime ka m mata ihe ọ na-ewe iji nweta nke a? Echere m na ọmụmụ Bible ebe obibi nke a ga-enye aka ịgba m ume.”
Ọ bụrụ na ị ga-achọ inweta otu akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi ma ọ bụ na ị ga-achọ ka mmadụ duziere gị ọmụmụ Bible ebe obibi, biko dega akwụkwọ na Watch Tower, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State, Nigeria, ma ọ bụ n’adres dịkarịsịrị gị nso e depụtara na peji nke 5.