Site n’Aka Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị
Enweghị Ọrụ Ekelee m unu nke ukwuu maka usoro isiokwu ahụ bụ́ “Enweghị Ọrụ—E Nwere Ihe Ngwọta.” (March 8, 1996) Ọ bịara n’oge m nọ na-achọ ọrụ, ma ọ dịghị nke m pụrụ ịchọta. Agbalịrị m ikepụta ọrụ n’ebe obibi, dị ka unu kwuru na peji nke 11, ọ na-agakwara m nke ọma. Ekele dịrị Jehova maka unu!
J. M., French Guiana
Isiokwu ahụ kọwara ọnọdụ m chọtara onwe m n’ime ya n’oge na-adịbeghị anya. N’ime ọnwa ole na ole, emere m mgbanwe iji kwekọọ n’ịrụ “ụdị ọrụ ọ bụla,” dị nnọọ ka otu isiokwu kwuru. Ma enweghị m nkụda aka. Agbalịrị m inwe nchekwube, n’ikpeazụkwa achọtara m ọrụ na-adịgide adịgide. N’oge ahụ, enwetara m enyemaka nwunye m, bụ́ onye na-adịghị emefusị ihe ma ọlị n’ịzụ ihe. Ekelee m unu ọzọ maka ihe ọmụma na-enyere anyị aka itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ n’ọnọdụ ndị siri ike.
U. C., Itali
Enwere m mmasị karịsịa n’igbe unu bụ́ “Ikepụta Ọrụ n’Ebe Obibi.” Abụ m onye ọsụ ụzọ oge nile, onye na-ekwusa ozi ọma oge nile, ruokwa afọ abụọ ahụrụ m maka ebe nlekọta ụmụaka n’ehihie bụ́ nke nwere akwụkwọ ikike. Elekọtara m ụmụaka tupu na mgbe a gbasasịrị akwụkwọ, ma nwetakwa ezigbo ego. O nyere m ohere ime nkwusa n’etiti ụbọchị, arụkwara m ọrụ nanị hour anọ kwa ụbọchị. Ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ nwere obi ekele n’ihi na ọ dịghị mfe ịchọta nlekọta dị mma. Enwere m olileanya na ndị ọzọkwa ga-enwe ike ịchọta ọrụ ga-enyere ha aka n’ijere Jehova ozi.
T. K. L., United States
Unu tụrụ aro na ndị na-enweghị ọrụ pụrụ ịmalite n’onwe ha ọrụ iji ákwà fụchie oche, ịkpa isi, ọrụ ilekọta gburugburu ebe obibi, na ndị ọzọ. Unu kwukwara na n’okpuru ọnọdụ ụfọdụ ha pụrụ ịkpọsa ije ozi ha n’efu ma ọ bụ n’ọnụ ego dị ala. Nke a ọ́ gaghị abụ ihe iwu na-akwadoghị na Germany?
R. T., Germany
Iwu dịgasị iche site ná mba gaa ná mba, ikekwe aro ndị a ga-abụ ndị iwu na-akwadoghị n’ala ụfọdụ. Nke ahụ mere anyị ji rụtụ aka na peji nke 9 mkpa ọ dị ịmata na ịsọpụrụ iwu ụtụ ego na ụtụ isi tupu a na-etinye aka n’ọrụ dị otú ahụ. Ọ bụ ibu ọrụ dịịrị ndị Kraịst irube isi n’iwu nke ala ndị ha bi n’ime ha. (Ndị Rom 13:1)—ED.
Ogige A Na-edebe Anụ Ọhịa Enwere m mmasị dị ukwuu n’isiokwu bụ́ “Ịmụ Bible—N’ogige A Na-edebe Anụ Ọhịa!” (March 8, 1996) Ihe ọmụma banyere anụmanụ ndị a kpọtụrụ aha na Bible masịrị m. Ọ dịbeghị mgbe m maara na a kpọtụrụ ịnyịnya ibu ọhịa aha na Bible. Paragraf kwuru banyere ndanda masịkwara m. Isiokwu ahụ agbawo m ume ime nnyocha banyere otu anụmanụ dị iche kwa ọnwa.
M. F., United States
Ezi Enyi M Achọrọ m ikwupụta ekele m sitere n’obi maka isiokwu ahụ magburu onwe ya, bụ́ “Ezi Enyi M.” (March 8, 1996) Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ ịgụ na ọbụbụenyi mara mma otú ahụ dịrị n’agbanyeghị ọdịiche dị otú ahụ n’afọ ndụ. Ọ na-egosi na ọ dịghị mkpa ka ndị ntorobịa nwee nanị ndị ọgbọ ha dị ka ndị enyi dịkarịsịrị ha nso. E nwere ọtụtụ ndị agadi bara uru dị ukwuu n’ụzọ ahụmahụ, amamihe, na ịkpa ọchị.
S. T., England
Isiokwu ahụ gosiri na ndị na-eto eto na ndị agadi pụrụ ịdị ná mma, nakwa na ndị na-eto eto pụrụ irite uru site n’ahụmahụ bara ụba nke ndị agadi. Mụ onwe m etinyewo ọtụtụ hour na-akpali mmasị ma dị mma na-esoro otu enyi tọrọ m na-anọkọ. O mewo ọtụtụ ihe iji nyere m aka ime ihe banyere nsogbu ndị dị ka nrụgide ndị ọgbọ.
W. S., Austria
Ruo ugbu a agbalịbeghị m ịmụta ihe n’ọnụ ndị agadi. N’ihi isiokwu a, ana m aghọta ugbu a ihe ndị m pụrụ ịmụta site n’ọnụ ndị dị otú ahụ. Achọrọ m n’ezie ịghọ enyi dị nso nke ụfọdụ ndị agadi jupụtara n’amamihe.
R. K., Japan