Enyi Anyị Kasị Mma Nọ n’Ógbè Ndị Mmụọ
BIBLE na-enye anyị nkọwa doro anya nke ndị bi n’ógbè ndị mmụọ. Jehova Chineke bụ onye kasị elu n’eluigwe. Jisọs Kraịst na-esote Jehova n’ikike na ịbụisi. Ndị mmụọ ozi na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke na-eje ozi dị ka ndị ozi nye ma Chineke ma ndị ya nọ n’elu ala. Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-emegide Chineke, na-eduhiekwa ụmụ mmadụ. Ndị nwụrụ anwụ na-ehi ụra n’ọnwụ ruo mgbe Chineke ga-akpọlite ha.
Ndị Mmụọ Ọjọọ Chọrọ Ofufe Anyị
Ebe ọ bụ na ndị nwụrụ anwụ adịghị ndụ, ọ dịghị ihe a pụrụ irite site n’ife ha ofufe. Ịchụrụ ndị nwụrụ anwụ àjà na-akwado nanị ụgha Setan na ndị mmụọ ọjọọ.
Ofufe anyị ọ̀ na-agụ ndị mmụọ ozi Chineke agụụ? Ọ dịghị ma ọlị! Ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi na-enye Chineke otuto ma na-agba ụmụ mmadụ ume ime otu ihe ahụ. Ugboro abụọ, Jọn onyeozi nwara ife ndị mmụọ ozi ofufe, ma ha baara ya mba, na-asị: “Lezie anya ka ị ghara ime ya: . . . kpọọ isiala nye Chineke.”—Mkpughe 19:10; 22:8, 9.
Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya, n’ụzọ dị iche n’ebe ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi nọ, chọrọ ka e fee ha ofufe nyekwa ha otuto. Nke a pụtara ìhè mgbe Setan nwara Jisọs mgbe Jisọs bụ mmadụ n’elu ala. Bible na-akọ, sị: “Ekwensu kuuru [Jisọs] gaa ugwu dị nnọọ oké elu, wee gosi Ya alaeze nile nke ụwa, na ebube ha; o wee sị Ya, Ihe ndị a nile ka m ga-enye Gị, ọ bụrụ na Ị ga-ada n’ala kpọọ isiala nye m.”—Matiu 4:8, 9.
Jisọs zara, sị: “Laba, Setan: n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Onyenwe anyị Chineke gị ka ị ga-akpọ isiala nye, ọ bụkwa nanị Ya ka ị ga-ekpere.” (Matiu 4:10) Jisọs maara Iwu Jehova, ọ jụkwara imebi ya.—Deuterọnọmi 6:13.
Ọ bụ ezie na Setan enweghị ike ime ka Jisọs fee ya ofufe, o nwewo ihe ịga nke ọma n’ebe ndị ọzọ nọ. N’ezie, mmadụ ole na ole na-akpachara anya efe Setan ofufe. Otú o sina dị, site n’ụzọ aghụghọ, nghọgbu, ụgha, na egwu, Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya echigharịwo ọtụtụ mmadụ pụọ n’ebe ofufe dị ọcha nke Jehova dị nke na Jọn onyeozi dere, sị: “Ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Ndị na-efe ofufe n’ụzọ megidere Okwu Chineke na-asọpụrụ Setan, ọ bụghị Jehova. Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Ihe ndị mba ọzọ na-achụ n’àjà, ha na-achụrụ ndị mmụọ ọjọọ, ọ bụghịkwa Chineke ka ha na-achụrụ.”—1 Ndị Kọrint 10:20.
Ofufe Dịịrị Jehova
E kwesịrị inye nanị Chineke ofufe anyị. Jehova gwara Mosis, sị: “Gị enwela Chi ọzọ tinyere m. Gị emerela onwe gị arụsị a pịrị apị, ma ọ bụ oyiyi nke ụdị ọ bụla nke dị n’eluigwe n’elu, ma ọ bụ nke dị n’ụwa n’okpuru ya, ma ọ bụ nke dị ná mmiri n’okpuru ụwa: gị akpọla isiala nye ha, efekwala ha ofufe: n’ihi na Mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, bụ Chineke ekworo.”—Ọpụpụ 20:3-5.
Ọ bụ ezie na Jehova dị ebube n’ịdị ukwuu, ọ na-ekwe ka a bịakwute ya. Jemes onye na-eso ụzọ kwuru, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, Ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jemes 4:8) Pọl onyeozi dere, sị: ‘Chineke anọghị n’ebe dị anya n’ahụ onye ọ bụla n’ime anyị.’ (Ọrụ 17:27) Jọn onyeozi dekwara, sị: “Nkwuwa okwu ahụ nke anyị nwere n’ebe [Jehova] nọ bụ nke a, na ọ bụrụ na anyị arịọ ihe ọ bụla dị ka ọchịchọ Ya si dị, Ọ na-anụ olu anyị: ọ bụrụkwa na anyị matara na Ọ na-anụ olu anyị n’ihe ọ bụla anyị na-arịọ, anyị matara na anyị nwere ihe arịrịọ ahụ anyị rịọworo n’aka Ya.”—1 Jọn 5:14, 15.
Rịba ama na Jọn dere na Jehova ga-aza arịrịọ anyị ma ọ bụrụ na anyị arịọ “dị ka ọchịchọ Ya si dị.” Iji mata ihe bụ ọchịchọ Chineke, anyị aghaghị ịmụta ihe Bible na-akụzi. Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka ịghọta Bible.
Ka ị na-amụtakwu banyere Jehova, ị ga-enwetakwu ihe ọmụma banyere ndị bi n’ógbè ndị mmụọ. Ihe ọmụma a na-eweta nnwere onwe pụọ na nkwenkwe ụgha, nkweta, na ọdịnala ndị Setan na-eji ejide ndị mmadụ n’egwu na agbụ. Site n’ezi ihe ọmụma Chineke, ị ga-amụta ịtụkwasị ya obi inyere gị aka izere ma ọ bụ imeri nsogbu kwa ụbọchị nke ndụ. Ị pụrụ ịghọ enyi Chineke. Chineke ga-aghọkwara gị “ebe mgbaba na ike, O mewo ka a chọta Ya n’inyeaka nke ukwuu ná mkpagbu nile.”—Abụ Ọma 46:1.
A Ga-ebibi Ikike Ọjọọ Nile
Enwela obi abụọ mgbe ọ bụla na ikike mmụọ nke ezi ihe ga-emeri ikike mmụọ nke ihe ọjọọ. A lụworị agha n’ógbè ndị mmụọ nke kpochapụrụ Setan na ajọ ndị òtù ya n’eluigwe. Akwụkwọ Mkpughe na-ekwu, sị: “Agha wee pụta n’eluigwe: Maịkael na ndị mmụọ ozi ya buru agha megide dragọn ahụ; dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya wee buo agha; ha enweghịkwa ike, a hụghịkwa ọnọdụ ha ọzọ n’eluigwe. E wee chụda dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ ochie ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi; a chụdara ya n’ụwa, chụdakwa ndị mmụọ ozi ya, ha na ya.”—Mkpughe 12:7-9.
Gịnị si n’agha ahụ pụta? Akụkọ ahụ na-aga n’ihu, sị: “N’ihi nke a, ka obi na-atọ unu ụtọ, unu eluigwe nile, na unu ndị bi n’ime ha. Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri: n’ihi na ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.” (Mkpughe 12:12) Ndị nọ n’eluigwe pụrụ ịṅụrị ọṅụ, ebe ọ bụ na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya anọkwaghị n’ebe ahụ ịkpata nsogbu. Otú ọ dị, nchụpụ a chụpụrụ ya n’eluigwe ewetawo ọtụtụ ahụhụ, oké nsogbu, nye ndị nọ n’ụwa. Anyị na-ebi n’oge ahụhụ ahụ ugbu a.—2 Timoti 3:1-5.
Ọdịnihu Na-enweghị Ihe Ọjọọ
Ma, Bible na-enyekwa olileanya. Ọ na-emesi anyị obi ike na Ekwensu nwere “nanị nwa oge” tupu a napụ ya ike. Mgbe nke ahụ mere, Jehova ga-ewetara ndị nile nọ n’elu ala na-achọ ọbụbụenyi ya ngọzi ndị dị ebube. Tụlee ole na ole n’ime nkwa ya maka ọdịnihu:
“Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile; mkpụrụ ya ga na-eme mkpatụ.”—Abụ Ọma 72:16.
“Ndị M họpụtaworo ga-enwekwa ihe aka ha rụtara mgbe dị anya nke ukwuu. Ha agaghị adọgbu onwe ha n’ọrụ n’efu.”—Aịsaịa 65:22, 23.
“Onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.”—Aịsaịa 33:24.
“Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, ọ bụkwa ntị nke ndị ntị chiri ka a ga-emeghe. Mgbe ahụ ka onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.”—Aịsaịa 35:5, 6.
“[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:4.
“Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29.
Nanị Jehova, bụ́ ezi Chineke ahụ, pụrụ imezu nkwa ndị dị otú ahụ dị ebube. Ọ dịghị ihe ga-egbochi ya imezu nzube ya. “Ọ dịghị okwu ọ bụla si Chineke n’ọnụ pụta nke na-agaghị adị irè.”—Luk 1:37.
[Foto ndị dị na peeji nke 29]
Ọ bụrụhaala na ị bụ enyi Chineke, ọ ga-enyere gị aka ịnagide nsogbu nke ndụ